Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI-EZE 17:8-24

I. NDI-EZE 17:8-24 IGBOB

Okwu Jehova we rue ya nti, si, Bilie, je Zarefat, nke diri Zaidon, biri n'ebe ahu: le, enyewom otù nwayi di-ya nwuru nọ n'ebe ahu iwu izù gi. O we bilie, je Zarefat, biarue ọnu-uzọ-ama obodo ahu, ma, le, n'ebe ahu ka nwayi di-ya nwuru nọ nāchikọta nkú: o we kpọ ya òkù, si, Biko, kuterem nwantī miri n'ihe, ka m'we ṅua. O we je ikute ya, Elaija we kpọ ya òkù, si, Biko, wetaram iberibe achicha n'aka-gi. Nwayi ahu we si, Jehova, bú Chineke-gi, nādi ndu, Ọ dighi ob͕e achicha m'nwere ma-ọli, ma nání otù nju-aka utu ọka n'okpokoro, na nwantī manu n'ite: ma, le, anamachikọta nkú abua, ka m'we ba, were ya doziere onwem, dozi-kwa-ra nwam nwoke, ka ayi we rie ya, nwua. Elaija we si ya, Atula egwu; ba, mere dika okwu-gi si di: nání buru uzọ merem ob͕e achicha ntà site na ya, weputaram ya, ma mere onwe-gi, me-kwa-ra nwa-gi nwoke, n'ikpe-azu. N'ihi na otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Okpokoro utu ọka ahu agaghi-agwu, ite manu ahu agaghi-akọ gi kwa, rue ubọchi Jehova gēnye miri-ozuzo n'elu uwa. O we je me dika okwu Elaija si di: nwayi ahu we rie, ya onwe-ya, na Elaija, na ulo-ya, ọtutu ubọchi. Okpokoro utu ọka ahu agwughi, ite manu ahu akọghi kwa, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n'aka Elaija. O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na nwa nke nwayi ahu, bú nwayi nwe ulo, riara ọria; ọria-ya we di ike nke-uku, rue mb͕e ume nāfọdughi nime ya. Nwayi ahu we si Elaija, Gini ka mu na gi nwekọrọ, gi onye nke Chineke? ì biakutewom ime ka echeta nmehiem, na ime ka nwam nwoke nwua? Ọ si ya, Nyem nwa-gi nwoke. O we kuputa ya n'obi-ya, kugo ya n'ime-ulo-elu, ebe ya onwe-ya nānọdu, ọ tọb͕ọ ya n'ihe-ndina-ya. Ọ kpọkue Jehova, si, Jehova, bú Chinekem, ọ̀ bu kwa nwayi a di-ya nwuru, nke mu onwem nānọ n'ulo-ya dika ọbìa, ka I mejọworo, n'ime ka nwa-ya nwoke nwua? O setia onwe-ya n'aru nwata ahu ub͕ò atọ, kpọkue Jehova, si, Biko, Jehova, bú Chinekem, ka nkpuru-obi nwata nka biaghachi nime ya. Jehova we ge nti olu Elaija; nkpuru-obi nwata ahu we biaghachi nime ya, ọ we di ndu. Elaija we kuru nwata ahu, si n'ime-ulo-elu ahu kudata ya n'ulo, nye ya nne-ya: Elaija we si, Le, nwa-gi nādi ndu. Nwayi ahu we si Elaija, Ub͕u a amawom nka na onye nke Chineke ka i bu, na okwu Jehova bu kwa ezi-okwu n'ọnu-gi.