Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI-EZE 17:8-24

I. NDI-EZE 17:8-24 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)

Okwu ONYENWE ANYị bịakwutere ya, “Bilie, jee Zarefat, obodo dị Saịdọn nso, biri nʼebe ahụ. O nwere otu nwanyị di ya nwụrụ, onye m nyere iwu ka o nye gị nri.” Ịlaịja biliri jee Zarefat. Mgbe o ruru ọnụ ụzọ ama e si abanye obodo ahụ, ọ hụrụ otu nwanyị di ya nwụrụ ka ọ nọ na-achịkọta nkụ. Ịlaịja kpọrọ ya oku sị ya, “Biko, kutere m ntakịrị mmiri nʼiko ka m ṅụọ.” Mgbe nwanyị ahụ na-aga ikute mmiri ahụ, Ịlaịja kpọrọ ya oku ọzọ sị ya, “Biko, wetara m otu iberibe achịcha ka m taa.” Ma nwanyị ahụ zara sị ya, “Dịka ONYENWE ANYị Chineke na-adị ndụ, enweghị m achịcha ọbụla nʼụlọ m. Naanị ihe m nwere bụ otu njuaka ụtụ ọka dị nʼite, na mmanụ ntakịrị dị na karama. Ugbu a, ana m achịkọta nkụ ka m baa ga siere onwe m siekwara nwa m nri, ka anyị rie, chere ọnwụ ga-abịa egburu anyị.” Ịlaịja sịrị ya, “Atụla egwu! Gaa mee dịka i kwuru. Ma naanị buru ụzọ meere m ogbe achịcha ntakịrị site nʼihe i nwere, wetara m ya. Emesịa, mee nke gị na nwa gị ga-eri. Nʼihi na nke a bụ ihe ONYENWE ANYị, Chineke Izrel kwuru, ‘Ụtụ ọka dị nʼite ahụ agaghị agwụ, mmanụ ahụ dị nʼite ahụ agakwaghị akọ tutu ruo ụbọchị ahụ ONYENWE ANYị ga-ezite mmiri ozuzo nʼala a.’ ” Nwanyị ahụ mere dịka Ịlaịja kwuru. Sitekwa nʼụbọchị ahụ gaa nʼihu, ihe oriri akọkwaghị Ịlaịja na nwanyị ahụ, na ezinaụlọ ya. Nʼihi na ụtụ ọka ahụ agwụghị, mmanụ akọkwaghị nwanyị ahụ, dịka okwu ONYENWE ANYị kwuru site nʼọnụ Ịlaịja, onye amụma. Mgbe ihe ndị a gasịrị, nwa nwanyị ahụ nwe ụlọ rịara ọrịa. Ọrịa a bịara sie ike nke ukwuu na ume afọdụghị nʼime ya. Mgbe ahụ, nwanyị ahụ kwaara akwa bịakwute Ịlaịja sị ya, “Ewoo, onye nke Chineke, gịnị ka i nwere megide m? Ị bịara ka i chetara m mmehie m, na igbu nwa m nwoke?” Ịlaịja zara sị ya, “Kunye m nwa gị nwoke.” Ịlaịja kuuru ya site nʼaka nne ya rigoo nʼụlọ elu ebe ya onwe ya na-edina, nibe ya nʼelu ihe ndina ya. Ọ kpọkuru ONYENWE ANYị sị ya, “ONYENWE ANYị Chineke m, gịnị mere i ji wetara nwanyị a m bi nʼụlọ ya ihe mgbu site nʼikwe ka nwa nwoke ya nwụọ?” Ịlaịja gbatịrị onwe ya nʼahụ nwantakịrị ahụ ugboro atọ, kpọkuo ONYENWE ANYị, sị, “Biko, ONYENWE ANYị Chineke m, kwere ka mkpụrụobi nwantakịrị a laghachikwute ya.” ONYENWE ANYị nụrụ ekpere Ịlaịja, ndụ nwantakịrị ahụ laghachikwutere ya, ọ dịkwara ndụ ọzọ. Mgbe ahụ, Ịlaịja kuuru ya si nʼụlọ elu ahụ rịdata, kunye ya nne ya, gwa ya okwu sị, “Lee, nwa gị dị ndụ!” Nwanyị ahụ sịrị Ịlaịja, “Ugbu a, amatala m na ị bụ onye nke chineke, na okwu ONYENWE ANYị si nʼọnụ gị apụta bụ eziokwu.”

I. NDI-EZE 17:8-24 Bible Nso (IGBOB)

Okwu Jehova we rue ya nti, si, Bilie, je Zarefat, nke diri Zaidon, biri n'ebe ahu: le, enyewom otù nwayi di-ya nwuru nọ n'ebe ahu iwu izù gi. O we bilie, je Zarefat, biarue ọnu-uzọ-ama obodo ahu, ma, le, n'ebe ahu ka nwayi di-ya nwuru nọ nāchikọta nkú: o we kpọ ya òkù, si, Biko, kuterem nwantī miri n'ihe, ka m'we ṅua. O we je ikute ya, Elaija we kpọ ya òkù, si, Biko, wetaram iberibe achicha n'aka-gi. Nwayi ahu we si, Jehova, bú Chineke-gi, nādi ndu, Ọ dighi ob͕e achicha m'nwere ma-ọli, ma nání otù nju-aka utu ọka n'okpokoro, na nwantī manu n'ite: ma, le, anamachikọta nkú abua, ka m'we ba, were ya doziere onwem, dozi-kwa-ra nwam nwoke, ka ayi we rie ya, nwua. Elaija we si ya, Atula egwu; ba, mere dika okwu-gi si di: nání buru uzọ merem ob͕e achicha ntà site na ya, weputaram ya, ma mere onwe-gi, me-kwa-ra nwa-gi nwoke, n'ikpe-azu. N'ihi na otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Okpokoro utu ọka ahu agaghi-agwu, ite manu ahu agaghi-akọ gi kwa, rue ubọchi Jehova gēnye miri-ozuzo n'elu uwa. O we je me dika okwu Elaija si di: nwayi ahu we rie, ya onwe-ya, na Elaija, na ulo-ya, ọtutu ubọchi. Okpokoro utu ọka ahu agwughi, ite manu ahu akọghi kwa, dika okwu Jehova si di, nke O kwuru n'aka Elaija. O rue, mb͕e ihe ndia gasiri, na nwa nke nwayi ahu, bú nwayi nwe ulo, riara ọria; ọria-ya we di ike nke-uku, rue mb͕e ume nāfọdughi nime ya. Nwayi ahu we si Elaija, Gini ka mu na gi nwekọrọ, gi onye nke Chineke? ì biakutewom ime ka echeta nmehiem, na ime ka nwam nwoke nwua? Ọ si ya, Nyem nwa-gi nwoke. O we kuputa ya n'obi-ya, kugo ya n'ime-ulo-elu, ebe ya onwe-ya nānọdu, ọ tọb͕ọ ya n'ihe-ndina-ya. Ọ kpọkue Jehova, si, Jehova, bú Chinekem, ọ̀ bu kwa nwayi a di-ya nwuru, nke mu onwem nānọ n'ulo-ya dika ọbìa, ka I mejọworo, n'ime ka nwa-ya nwoke nwua? O setia onwe-ya n'aru nwata ahu ub͕ò atọ, kpọkue Jehova, si, Biko, Jehova, bú Chinekem, ka nkpuru-obi nwata nka biaghachi nime ya. Jehova we ge nti olu Elaija; nkpuru-obi nwata ahu we biaghachi nime ya, ọ we di ndu. Elaija we kuru nwata ahu, si n'ime-ulo-elu ahu kudata ya n'ulo, nye ya nne-ya: Elaija we si, Le, nwa-gi nādi ndu. Nwayi ahu we si Elaija, Ub͕u a amawom nka na onye nke Chineke ka i bu, na okwu Jehova bu kwa ezi-okwu n'ọnu-gi.