Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI-EZE 13

13
1Ma, le, onye nke Chineke siri na Juda bia n'okwu Jehova rue Bet-el: ma Jeroboam nēguzo n'akuku ebe-ichu-àjà isure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ. 2O we kpọ òkù megide ebe-ichu-àjà ahu n'okwu Jehova, si, Ebe-ichu-àjà, ebe-ichu-àjà, otú a ka Jehova siri: Le, agāmuru ulo Devid otù nwa-nwoke, Josaia bu aha-ya; ọ gāchu kwa n'elu gi ndi-nchu-àjà nke ebe di elu ndi nēsure ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ n'elu gi, ọkpukpu madu ka ha gēsure kwa ọku n'elu gi. 3O nye-kwa-ra ihe-iriba-ama n'ubọchi ahu, si, Nka bu ihe-iriba-ama ahu nke Jehova kwuworo: Le, agāb͕awa ebe-ichu-àjà nka, wusi kwa ntu nke di n'elu ya. 4O rue, mb͕e eze nuru okwu onye nke Chineke ahu, nke ọ kpọrọ megide ebe-ichu-àjà nime Bet-el, na Jeroboam siri n'ebe-ichu-àjà setipu aka-ya, si, Jidenu ya. Aka-ya, nke o setiri imegide ya, we kpọnwua, ọ pughi kwa iseghachi ya n'aru ya. 5Ab͕awa-kwa-ra ebe-ichu-àjà ahu, ewe si n'ebe-ichu-àjà wusi ntu, dika ihe-iriba-ama si di nke onye nke Chineke nyere n'okwu Jehova. 6Eze we za, si onye nke Chineke, Biko, chọ ime ka iru Jehova, bú Chineke-gi, dajua, gi kpe kwa ekpere bayerem, ka akam we laghachikutem. Onye nke Chineke ahu we chọ ka iru Jehova dajua, aka eze we laghachikuru ya, we di ka ọ di na mbu. 7Eze we si onye nke Chineke ahu, Sorom ba n'ulo, b͕a onwe-gi ume, m'gēnye kwa gi onyinye. 8Onye nke Chineke ahu we si eze, Ọ buru na i nyem nkera ulo-gi, m'gaghi-esoro gi ba, m'gaghi-eri kwa nri, m'gaghi-aṅu kwa miri n'ebe a: 9n'ihi na otú a ka enyerem iwu n'okwu Jehova, si, Erila nri, aṅu-kwa-la miri, alaghachi-kwa-la n'uzọ i siri je. 10O we la n'uzọ ọzọ, ọ laghachighi kwa n'uzọ o siri biaru Bet-el.
11Ma otù onye-amuma, bú agadi, bi na Bet-el; nwa-ya we bia, kọrọ ya akukọ omume nile nke onye nke Chineke mere ubọchi ahu na Bet-el: okwu nile ọ gwara eze, ha we kọrọ nna-ha akukọ okwu ahu. 12Nna-ha we gwa ha okwu, si, Òle nke bu uzọ o jere? Ma umu-ya ndikom ahuwo uzọ nke onye nke Chineke ahu jere, bú onye siri na Juda bia. 13O we si umu-ya, Jikwaranum inyinya-ibu. Ha we jikwara ya inyinya-ibu: ọ nọkwasi n'elu ya. 14O we jeso onye nke Chineke ahu n'azu, chọta ya ka ọ nānọdu n'okpuru osisi terebinth: ọ si ya, Ọ̀ bu gi onwe-gi bu onye Chineke ahu nke siri na Juda bia? Ọ si, Ọ bu mu onwem. 15Ọ si ya, Sorom je n'ulo, ri kwa nri. 16Ọ si, Apughm isoro gi laghachi, ma-ọbu isoro gi ba n'ulo: m'gaghi-esoro kwa gi ri nri ma-ọbu iṅu miri n'ebe a: 17n'ihi na okwu rurum nti n'okwu Jehova, si, Erila nri, aṅu-kwa-la miri, n'ebe ahu, alaghachi-kwa-la ila n'uzọ ahu i jere nime ya. 18Ọ si ya, Mu onwem bu kwa onye-amuma dika gi; mọ-ozi we gwam okwu n'okwu Jehova, si, Me ka o soro gi lata n'ulo-gi, ka o we rie nri ṅu kwa miri. Ma ọ gwara ya okwu-ugha. 19O we soro ya laghachi, rie nri n'ulo-ya, ṅu kwa miri. 20O rue, mb͕e ha abua nānọdu nēri ihe na table, na okwu Jehova ruru onye-amuma ahu nti, bú onye mere ka ọ laghachi: 21ọ kpọ onye nke Chineke ahu òkù, bú onye siri na Juda bia, si, Otú a ka Jehova siri, N'ihi na i nupuwo isi n'okwu-ọnu Jehova, i we ghara idebe ihe enyere n'iwu, nke Jehova, bú Chineke-gi, nyere gi n'iwu, 22i we laghachi, rie nri, ṅua miri, n'ebe nke Ọ gwara gi okwu, si, Erila nri, aṅu-kwa-la miri; ozu-gi agaghi-abiaru ílì nna-gi-hà. 23O rue, mb͕e o risiri nri, mb͕e ọ ṅusi-kwa-ra ihe-ọṅuṅu, na o were inyinya-ibu jikwara ya, bú onye-amuma ahu nke o mere ka ọ laghachi. 24Ọ we la, ọdum we huta ya n'uzọ, me ka ọ nwua: ewe tupu ozu-ya n'uzọ, inyinya-ibu-ya nēguzo kwa n'akuku ya; ọdum ahu nēguzo kwa n'akuku ozu ahu. 25Ma, le, ndikom nāgabiga, ha we hu ozu, ka atupuru ya n'uzọ, hu kwa ọdum, ka o nēguzo n'akuku ozu ahu: ha we bia, kwue ya n'obodo nke onye-amuma ahu, bú agadi, nēbi nime ya. 26Onye-amuma ahu nke mere ka o si n'uzọ laghachi we nu ya, ọ si, Onye nke Chineke ahu ka ọ bu, bú onye nupuru isi n'okwu-ọnu Jehova: Jehova we were ya nye ọdum, o we dọb͕ue ya, me ka ọ nwua, dika okwu Jehova si di, nke Ọ gwara ya. 27O we gwa umu-ya okwu, si, Jikwaranum inyinya-ibu. Ha we jikwa ya. 28O je chọta ozu-ya, ka atupuru ya n'uzọ, na inyinya-ibu na ọdum, ka ha nēguzo n'akuku ozu ahu: ọdum erighi ozu ahu, ọ dọb͕ughi kwa inyinya-ibu ahu. 29Onye-amuma ahu we bulie ozu onye nke Chineke ahu, dọba ya n'elu inyinya-ibu ahu, bughachi ya: ọ biarue obodo onye-amuma ahu, bú agadi, iti aka n'obi, na ilì ya. 30Ọ dọba ozu-ya n'ílì-ya; ha we tiere ya aka n'obi, si, Ewó, nwa-nnem! 31O rue, mb͕e o lìsiri ya na ọ gwara umu-ya okwu, si, Mb͕e m'nwuru, lì-kwa-num n'ílì nke elìri onye nke Chineke; dọba ọkpukpum n'akuku ọkpukpu-ya. 32N'ihi na okwu ahu aghaghi irè, bú nke ọ kpọrọ òkù n'okwu Jehova megide ebe-ichu-àjà nke di na Bet-el, megide kwa ulo nile nke ebe di elu nke di n'obodo nile nke Sameria. 33Mb͕e ihe a gasiri, Jeroboam esighi n'uzọ ọjọ ya laghachi, ma o me-kwa-ra ndi-nchu-àjà nke ebe di elu ọzọ site n'ọnu-ọgugu nile nke ndi Israel: onye ihe-ya nātọ ya utọ, o mejue ya aka, o we ghọ otù nime ndi-nchu-àjà nke ebe di elu. 34Ihe a we ghọrọ ulo Jeroboam nmehie, ọbuná izopu ya, na ikpochapu ya n'elu uwa.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. NDI-EZE 13: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye