Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. NDI KỌRINT 8

8
1Ma okwu bayere ihe achuru n'àjà nye arusi: Ayi matara na ayi nile nwere ọmuma-ihe. Ọmuma-ihe nāfuli elu, ma ihu-n'anya nēwuli elu dika ulo. 2Ọ buru na onye ọ bula nēchè na ya mara ihe ọ bula, ọ kāmaghi dika ọ nāghaghi ima; 3ma ọ buru na onye ọ bula nāhu Chineke n'anya, onye ahu ka Chineke mara. 4Ya mere okwu bayere iri ihe achuru n'àjà nye arusi, ayi matara na ọ dighi arusi ọ bula bu ihe n'uwa, ayi mata-kwa-ra na ọ dighi Chineke ọzọ ma-ọbughi otù. 5N'ihi na asi na ọ bu kwa ezie na ndi anākpọ chi di, ma ọ bu n'elu-igwe ma-ọbu n'elu uwa; dika ọtutu chi na ọtutu ndi-nwe-madu di; 6ma n'ebe ayi nọ otù Chineke di, bú Nna, Onye ihe nile sitere na Ya, Onye ayi onwe-ayi di-kwa-ra Ya; otù Onye-nwe-ayi di kwa, bú Jisus Kraist, Onye ihe nile sitere n'aka-Ya, ayi onwe-ayi site-kwa-ra n'aka-Ya. 7Otú ọ di ọ bughi nime madu nile ka ọmuma-ihe ahu di: kama ufọdu, ebe arusi bu ihe anēme n'ala-ha rue ub͕u a, ha nēri ihe ahu dika ihe achuru n'àjà nye arusi; anēmeru kwa akọ-na-uche-ha, ebe ọ nādighi ike. 8Ma ihe-oriri agaghi-eche ayi n'iru Chineke: ma asi na ayi erighi, ọ dighi ihe fọduru ayi inwe; ma asi kwa na ayi nēri, ayi ababigaghi ókè. 9Ma lezienu anya ka ike-unu nka ghara isi n'uzọ ọ bula ghọ ihe gēme ka ndi nādighi ike su ngọngọ. 10N'ihi na asi na onye ọ bula ahú gi, bú onye nwere ihe-ọmuma, ka i nānọdu na nri nime ulo arusi, akọ-na-uche-ya, ma ọ buru na ọ dighi ike, àgaghi-ewuli ya elu dika ulo iri ihe achuru n'àjà nye arusi? 11N'ihi na site n'ihe-ọmuma-gi onye ahu nke nādighi ike nāla n'iyì, bú nwa-nna-gi nke Kraist nwuru n'ihi ya. 12Ma otú a, mb͕e unu nēmehie megide umu-nna-unu, nētib͕u kwa akọ-na-uche-ha mb͕e ọ nādighi ike, unu nēmehie megide Kraist. 13N'ihi nka, ma ọ buru na ihe-oriri eme ka nwa-nnam ma n'ọnyà, m'gaghi-eri anu ma-ọli rue mb͕e ebighi-ebi, ka m'ghara ime ka nwa-nnam ma n'ọnyà.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. NDI KỌRINT 8: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye