Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. IHE EMERE 5

5
1Ma umu-ndikom Reuben ọkpara Israel, (n'ihi na onye ahu bu ọkpara; ma, n'ihi na o mere ute nna-ya ka ọ ghara idi nsọ, enyere umu Josef nwa Israel ọnọdu-ọkpara-ya; agaghi-ede kwa ya n'akwukwọ-osuso-ọmumu dika ọnọdu-ọkpara si di. 2N'ihi na Juda di ike n'etiti umu-nne-ya, onye-ndú we si nime ya puta; ma Josef nwere ọnọdu-ọkpara:) 3umu-ndikom Reuben ọkpara Israel; Hanok, na Palu, na Hezron, na Kami. 4Umu-ndikom Joel; Shemaia nwa-ya, Gog nwa-ya, Shimai nwa-ya; 5Maika nwa-ya, Reaia nwa-ya, Beal nwa-ya; 6Beera nwa-ya, onye Tilgat-pilnesa, bú eze Asiria, mere ka ọ je biri n'ala ọzọ: onye ahu bu onye-isi ndi Reuben nwere. 7Na umu-nne-ya ndikom dika ab͕uru nile ha si di, mb͕e edere akwukwọ-osuso-ọmumu nke osuso-ọmumu nile ha; onye-isi, bú Jeiel, na Zekaraia, 8na Bela nwa Azaz, nwa Shema, nwa Joel, onye ahu bi n'Aroea, we rue Nebo na Beal-meon: 9ma n'ọwuwa-anyanwu o biruru nbata ọzara, bú site n'osimiri Yufretis: n'ihi na anu-ulo-ha bara uba n'ala Gilead. 10Ma n'ubọchi Sọl ha busoro ndi Haga agha, ndi dara n'aka-ha: ha we biri n'ulo-ikwū-ha n'elu ala nile nke ọwuwa-anyanwu Gilead.
11Umu Gad biri kwa na ncherita-iru ha, n'ala Beshan rue Saleka: 12Joel, bú onye-isi, na Shafam, bú nke-abua, na Janai, na Shefat nime Beshan: 13na umu-nne-ha ndikom nke ulo nke ndi bu nna-ha; Maikael, na Meshulam, na Sheba, na Jorai, na Jakan, na Zia, na Iba, asa. 14Ndia bu umu-ndikom Abihail nwa Huri, nwa Jaroa, nwa Gilead, nwa Maikael, nwa Jeshishai, nwa Jahdo, nwa Buz; 15Ahi nwa Abdiel, nwa Guni, bú onye-isi ulo nke ndi bu nna-ha. 16Ha we biri na Gilead nime Beshan, na n'ime-obodo-ya, na n'ebe-ita-nri nile nke Sheron, rue ọpupu nile ha. 17Edere ha nile n'akwukwọ-osuso-ọmumu n'ubọchi Jotam, bú eze Juda, na n'ubọchi Jeroboam, bú eze Israel.
18Umu Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, nime ndi bu dìnkpà, ndikom nēbu ọta na mma-agha, nāzọgide kwa uta ikwe ya, ndi ezíwo-kwa-ra ibu agha, di orú nnù ndikom uzọ ise na nnù iri-na-otù na ọgu iri-na-asatọ, ndi nāpukuru usu-ndi-agha. 19Ha we buso ndi Haga, na Jetua, na Nafish, na Nodab, agha. 20Ewe yere ha aka imegide ha, ewe nye ndi Haga na ndi nile ha na ha yikọrọ n'aka-ha: n'ihi na ọ bu Chineke ka ha kpọkuru n'agha ahu, O we kwe ka ha riọta ihe ha riọrọ; n'ihi na ha tukwasiri Ya obi. 21Ha we chiri anu-ulo-ha n'agha: camel-ha orú nnù uzọ isi na nnù ise, na ìgwè ewu na aturu orú nnù orú uzọ na uzọ iri-na-otù na nnù ise, na inyinya-ibu nnù ise, na madu orú nnù uzọ iri-na-abua na nnù iri. 22N'ihi na ọtutu ndi eb͕uru eb͕u dara, n'ihi na agha ahu sitere na Chineke. Ha we biri n'ọnọdu ha rue mb͕e emere ka ha je biri n'ala ọzọ.
23Umu nkera ebo Manase biri kwa n'ala ahu: site na Beshan rue Beal-heamon na Senia na ugwu Heamon ka ndi ahu bara uba. 24Ma ndia bu ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha, bú Ifa, na Ishi, na Eliel, na Azriel, na Jeremaia, na Hodavaia, na Jahdiel, ndi-dike bu dìnkpà, ndikom amara aha-ha, ndi-isi ulo nke ndi bu nna-ha.
25Ha we mekpue emekpu megide Chineke nke ndi bu nna-ha, soro chi nile nke ndi ala ahu kwa iko, bú ndi Chineke kpochapuru n'iru ha. 26Chineke Israel we kpọte mọ Pul, bú eze Asiria, na mọ Tilgat-pilnesa, bú eze Asiria, o we me ka ha je biri n'ala ọzọ, bú ndi Reuben, na ndi Gad, na nkera ebo Manase, o we me ka ha biarue Hala, na Haboa, na Hara, na osimiri Gozan, rue ta.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. IHE EMERE 5: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye