Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. IHE EMERE 4

4
1Umu-ndikom Juda; Perez, na Hezron, na Kami, na Hua, na Shobal. 2Reaia nwa-nwoke Shobal we mua Jahat; Jahat we mua Ahumai na Lahad. Ndia bu ab͕uru ndi Zọra. 3Ndia bu kwa umu-ndikom nna Etam; Jezreel, na Ishma, na Idbash: aha nwa-nne-ha nwayi bu Hazelelponi: 4na Penuel nna Gedoa, na Iza nna Husha. Ndia bu umu-ndikom Hua, bú ọkpara Efrata, nna Bet-lehem. 5Ma Ashua nna Tekoa nwere ndinyom abua, bú Hela na Naara. 6Naara we muara ya Ahuzam, na Hifa, na Timeni, na Haahashtari. Ndia bu umu-ndikom Naara. 7Umu-ndikom Hela bu kwa Zeret, na Zoha, na Etnan. 8Koz we mua Anub, na Zobiba, na ab͕uru nile nke Ahahel nwa Harum. 9Ma asọpuru Jebez kari umu-nne-ya ndikom: ma nne-ya kpọrọ aha-ya Jebez, si, N'ihi na amurum ya n'ihe-nb͕u. 10Jebez we kpọkue Chineke Israel, si, Ọ gādim nọ̄ nma ma ọ buru na I gọziem n'ezie, me kwa ka ókè-alam rie nne, ọ buru kwa na aka-Gi gādiyerem, I we me ka m'pua n'ihe ọjọ, ka ọ ghara iwutam! Chineke we me ka ihe nke ọ riọrọ biarue ya aru. 11Kelub nwa-nne Shua we mua Mehia, onye ahu bu nna Eshton. 12Eshton we mua Bet-rafa, na Pasea, na Tehina, bú nna Ia-nehash. Ndia bu ndikom Rika. 13Umu-ndikom Kenaz kwa; Ọtniel, na Seraia: umu-ndikom Ọtniel kwa; Hatat. 14Meonotai we mua Ọfra: Seraia mu-kwa-ra Joab, bú nna Gi-harashim: n'ihi na ndi-ọ̀kà ka ha bu. 15Umu-ndikom Keleb nwa Jefune kwa; Iru, na Ila, na Naam: umu-ndikom Ila kwa; na Kenaz. 16Umu-ndikom Jehalelel kwa; Zif, na Zifa, na Tiria, na Asarel. 17Umu-ndikom Ezra kwa; Jeta, na Mered, na Ifa, na Jalon: o we mua Miriam, na Shamai, na Ishba, bú nna Eshtemoa. 18Nwunye-ya, bú Hajehudija, we mua Jered nna Gedoa, na Heba nna Soko, na Jekutiel nna Zanoa. Ndia bu kwa umu-ndikom Bitia, bú nwa-nwayi Fero, nke Mered luru na nwunye. 19Umu-ndikom nwunye Hodia, nwa-nne-nwayi Naham, bu nna Keila onye-Gamait, na Eshtemoa onye Meakat. 20Umu-ndikom Shimon kwa; Amnon, na Rina, na Ben-hanan, na Tilon. Umu-ndikom Ishi kwa; Zohet, na Ben-zohet. 21Umu-ndikom Shila nwa Juda; Ia nna Lika, na Laada nna Marisha, na ab͕uru nile nke ulo ndi nākpa ezi ákwà ọcha, nke ulo Ashbia; 22na Jokim, na ndikom Koziba, na Joash, na Saraf, bú ndi-nwe Moab, na Jashubi-lehem. Ma ihe ndia bu ihe ochie. 23Ndi ahu bu ndi-ọkpu-ite, na ndi bi na Netaim na Gedira; ọ bu n'aka eze n'ije-ozi-ya ka ha biri n'ebe ahu.
24Umu-ndikom Simeon; Nemuel, na Jamin, na Jarib, na Zera, na Shaul: 25Shalum nwa-ya, Mibsam nwa-ya, Mishma nwa-ya. 26Umu-ndikom Mishma kwa; Hamuel nwa-ya, Zakua nwa-ya, Shimai nwa-ya. 27Shimai nwe-kwa-ra umu-ndikom iri na isi, na umu-ndinyom isi; ma umu-nne-ya ndikom enweghi ọtutu umu-ndikom, ab͕uru-ha nile abaghi kwa uba, ra ka umu Juda. 28Ha we biri na Bia-sheba, na Molada, na Haza-shual; 29na nime Bilha, na n'Ezem, na nime Tolad; 30na nime Betuel, na nime Họma, na nime Ziklag; 31na nime Bet-makabot, na nime Haza-susim, na nime Bet-biri, na nime Shaaraim. Ndia bu obodo-ha rue mb͕e Devid bu eze. 32Obodo ntà ha bu Itam, na Ain, na Rimon, na Token, na Ashan, obodo ise: 33na obodo ntà ha nile nke di obodo ahu buruburu, rue Beal. Ndia bu ebe-obibi-ha, ha nwe-kwa-ra akwukwọ-osuso-ọmumu-ha. 34Na Meshobab, na Jamlek, na Josha nwa Amazaia; 35na Joel, na Jihu nwa Joshibia, nwa Seraia, nwa Asiel; 36na Elioenai, na Jaakoba, na Jeshohaia, na Asaia, na Adiel, na Jesimiel, na Benaia; 37na Ziza nwa Shifi, nwa Alon, nwa Jedaia, nwa Shimri, nwa Shemaia; 38Ndia ndi baworo n'akwukwọ n'aha bu ndi-isi n'ab͕uru-ha: ulo nke ndi bu nna-ha we basa rue ọtutu. 39Ha we jerue nbata Gedoa, rue n'akuku ọwuwa-anyanwu ndagwurugwu, ichọ ihe iji zù ìgwè ewu na aturu-ha. 40Ha we chọta ihe-ọzùzù mara abuba di kwa nma, ala ahu sa-kwa-ra mbara n'akuku-ya abua, nādi kwa jū, nwe kwa udo; n'ihi na ndi bi n'ebe ahu na mb͕e gara aga sitere na Ham. 41Ndia ndi edeworo n'akwukwọ n'aha we bia n'ubọchi Hezekaia, bú eze Juda, tib͕ue ọmuma-ulo-ikwū-ha, na Meunim ndi ahuru n'ebe ahu, ha we wezuga ha ka ebibie ha, rue ta, we biri n'ọnọdu ha: n'ihi na ihe eji zù ìgwè ewu na aturu-ha di n'ebe ahu. 42Ufọdu nime ha, bú ufọdu nime umu Simeon, nnù ndikom na ọgu ise, je-kwa-ra ugwu Sia; Pelataia, na Nearaia, na Refaia, na Uziel, bú umu Ishi, bu ndi-isi-ha. 43Ha we tib͕ue ndi fọduru n'etiti ndi Amalek b͕apuru ab͕apu, ha we biri n'ebe ahu, rue ta.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. IHE EMERE 4: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye