Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. IHE EMERE 3

3
1Ma ndia bu umu-ndikom Devid, ndi amuru nye ya nime Hebron: ọkpara-ya, bú Amnon, nwa Ahinoam nwayi Jezreel; nke-abua, Daniel, nwa Abigail nwayi Kamel; 2nke-atọ, Absalom nwa Meaka nwa-nwayi Talmai, bú eze Geshua; nke-anọ, Adonaija nwa Hagit; 3nke-ise, Shefataia nwa Abital; nke-isi, Itream nwa Egla, bú nwunye-ya. 4Umu isi ka amuru nye ya nime Hebron; o we buru eze n'ebe ahu arọ asa na ọnwa isi: orú arọ na iri na atọ ka ọ bu eze na Jerusalem. 5Ma ndia ka amuru nye ya nime Jerusalem: Shimea, na Shobab, na Netan, na Solomon, anọ, bú nke Bat-shua nwa-nwayi Amiel: 6na Ibha, na Elishama, na Elifelet; 7na Noga, na Nefeg, na Jafia; 8na Elishama, na Eliada, na Elifelet, iteghete. 9Ndia nile bu umu-ndikom Devid, nāgughi umu-ndikom ndi-iko-ya ndinyom; Tema bu nwa-nne-ha nwayi. 10Nwa Solomon bu Rehoboam, Abaija nwa-ya, Esa nwa-ya, Jehoshafat nwa-ya; 11Joram nwa-ya, Ehazaia nwa-ya, Joash nwa-ya; 12Amazaia nwa-ya, Azaraia nwa-ya, Jotam nwa-ya; 13Ehaz nwa-ya, Hezekaia nwa-ya, Manase nwa-ya; 14Emon nwa-ya, Josaia nwa-ya. 15Umu-ndikom Josaia kwa; ọkpara-ya Johanan, nke-abua Jehoiakim, nke-atọ Zedekaia, nke-anọ Shalum. 16Umu-ndikom Jehoiakim kwa: Jekonaia nwa-ya, Zedekaia nwa-ya. 17Umu-ndikom Jekonaia kwa, bú onye-nkpọrọ: Shealtiel nwa-ya, 18na Malkiram, na Pedaia, na Shenaza, na Jekamaia, na Hoshama, na Nedabaia. 19Umu-ndikom Pedaia kwa; Zerubabel, na Shimai: umu-ndikom Zerubabel kwa; Meshulam, na Hananaia; Shelomit bu nwa-nne-ha nwayi: 20na Hashuba, na Ohel, na Berekaia, na Hasadaia, na Jushab-hesed, ise. 21Umu-ndikom Hananaia kwa; Pelataia, na Jeshaia: umu-ndikom Refaia, umu-ndikom Anan, umu-ndikom Obadaia, umu-ndikom Shekanaia. 22Umu-ndikom Shekanaia kwa; Shemaia: umu-ndikom Shemaia kwa: Hatush, na Igal, na Baria, na Nearaia, na Shefat, isi. 23Umu-ndikom Nearaia kwa; Elioenai, na Hizkia, na Azrikam, atọ. 24Umu-ndikom Elioenai kwa; Hodavaia, na Elaiashib, na Pelaia, na Akub, na Johanan, na Delaia, na Anani, asa.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. IHE EMERE 3: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye