Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. IHE EMERE 21:15-30

I. IHE EMERE 21:15-30 IGBOB

Chineke we ziga mọ-ozi na Jerusalem ibibi ya: ma mb͕e ọ gaje ibibi, Jehova huru, we chègharia n'ihe ọjọ ahu, we si mọ-ozi ahu nke nēbibi, O zuwo; ub͕u a ra aka-gi. Ma mọ-ozi nke Jehova nēguzo n'akuku ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus. Devid we welie anya-ya, hu mọ-ozi nke Jehova, ka o nēguzo n'etiti ala na elu-igwe, ya na mma-agha-ya amiputara amiputa n'aka-ya, nke esetiri n'elu Jerusalem. Devid na ndi-okenye we kpuru ákwà-nkpe da kpuchie iru-ha n'ala. Devid we si Chineke, Ọ̀ bughi mu onwem siri ka aguta ndi Israel? ọbuná mu onwem ka ọ bu, bú onye mehieworo, me kwa ihe ọjọ nke-uku; ma ìgwè aturu ndia, gini ka ha mere? biko, Jehova, bú Chinekem, ka aka-Gi digidem, digide kwa ulo nnam; ma ka ọ ghara idigide ndi-Gi, ka etie ha ihe-otiti. Mọ-ozi nke Jehova we si Gad ka ọ si Devid ka Devid rigo, me ka ebe-ichu-àjà guzoro Jehova n'ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus. Devid we rigo n'okwu Gad nke o kwuru n'aha Jehova. Ọnan we chigharia, hu mọ-ozi ahu; umu-ya ndikom anọ ndi ya na ha nọ we nēzo onwe-ha. Ma Ọnan nāzọcha ọka wheat. Devid we biakute Ọnan, Ọnan we legide anya, hu Devid, si n'ebe-nzọcha-ọka-ya puta, kpọ isi ala nye Devid, kpuchie iru-ya n'ala. Devid we si Ọnan, Nyem ebe a, bú ebe-nzọcha-ọka nka, ka m'we wuere Jehova ebe-ichu-àjà nime ya: n'ego zuru ezu o ruru ka i gēnyem ya: ka ewe b͕ochie ihe-otiti a n'ebe ndi Israel nọ. Ọnan we si Devid, Were ya n'onwe-gi, ka onye-nwem, bú eze, me kwa ihe di nma n'anya-ya: le, enyewom gi ehi iji chu àjà-nsure-ọku, na ihe nzọcha-ọka ka ha buru nkú, na ọka wheat ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma; ihe nile ka m'nyeworo. Eze, bú Devid, we si Ọnan, É-è; kama aghaghm izuru ya n'ego zuru ezu o ruru: n'ihi na m'gaghi-ewere ihe i nwere ichuru Jehova àjà, m'gaghi-esure kwa àjà-nsure-ọku nke m'nētiyeghi ego ọ bula. Devid we nye Ọnan nnù shekel ọla-edo na ọgu iri n'ọtùtù iji zuru ebe ahu. Devid we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo, kpọkue Jehova; Ọ we were ọku si n'elu-igwe za ya n'elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku. Jehova we gwa mọ-ozi ahu; o we mighachi mma-agha-ya n'ọbọ-ya. Na mb͕e ahu, mb͕e Devid huru na Jehova zara ya n'ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus, o we chua àjà n'ebe ahu. Ma ebe-obibi Jehova, nke Moses mere n'ọzara, na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, di n'ebe di elu nime Gibeon na mb͕e ahu. Ma Devid apughi ije n'iru ya iju Chineke ase: n'ihi na ọ turu egwu nke-uku n'ihi mma-agha mọ-ozi nke Jehova.