I. IHE EMERE 21:15-30
I. IHE EMERE 21:15-30 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Chineke zipụrụ mmụọ ozi ị ga bibie Jerusalem, ma dịka mmụọ ozi ahụ na-eme nke a, ONYENWE ANYị hụrụ ya, o wutere ya nʼihi mbibi ahụ. Ọ sịrị mmụọ ozi ahụ nke na-ebibi ndị mmadụ, “O zuola! Seghachi aka gị.” Mgbe ahụ, mmụọ ozi ONYENWE ANYị na-eguzo nʼebe ịzọcha ọka Arauna onye Jebus. Mgbe Devid leliri anya elu hụ mmụọ ozi ONYENWE ANYị ka o guzo nʼetiti mbara eluigwe na ụwa, hụkwa mma agha o ji, nke o chere ihu ya na Jerusalem, ya na ndị okenye Izrel yi akwa mkpe, dara nʼala kpuo ihu nʼala. Devid sịrị Chineke, “Ọ bụghị m nyere iwu ka a gụọ ndị tozuru ibu agha ọnụ? Ọ bụ mụ onwe m, mụ bụ onye ọzụzụ atụrụ, mehiere mee ajọ omume. Ma ndị a bụ naanị ụmụ atụrụ, gịnị kwanụ ka ha mere? ONYENWE ANYị Chineke m, biko ekwela ka ọrịa a na-efe efe nọgide nʼahụ ndị gị, ka aka gị dịgide naanị nʼahụ m, dịgidekwa nʼahụ ndị ụlọ m.” Mgbe ahụ, mmụọ ozi ONYENWE ANYị nyere Gad iwu ka ọ gwa Devid, ka ọ gaa wuore ONYENWE ANYị ebe ịchụ aja nʼebe ịzọcha ọka Arauna, onye Jebus. Ya mere, Devid rubere isi gaa dịka okwu ahụ Gad kwuru nʼaha ONYENWE ANYị. Mgbe Arauna nọ nʼebe ịzọcha ọka, ọ tụgharịrị hụ mmụọ ozi ahụ, ụmụ ya ndị ikom anọ ndị so ya guzo nʼebe ahụ zoro onwe ha. Mgbe Devid bịakwutere Arauna, Arauna weliri anya hụ ya, ọ hapụrụ ebe ịzọcha ọka ahụ, bịa kpọọ isiala nye Devid, kpudokwa ihu ya nʼala. Devid sịrị ya, “Nye m ebe a, bụ ala ebe ịzọcha ọka gị, ka m nwee ike wuore ONYENWE ANYị ebe ịchụ aja, ka akwụsị ọrịa a na-efe efe dakwasịrị ndị mmadụ. Resi m ya nʼọnụ ahịa o ruru.” Ma Arauna zara sị Devid, “Were ya ka onyenwe m eze mee ihe ọbụla dị ya nʼobi. Aga m enye ehi maka iji chụọ aja nsure ọkụ, ihe nzọcha ọka niile ka ha bụrụ nkụ na ọka wiiti maka ịchụ aja mkpụrụ ọka. Aga m enye ha niile.” Ma eze Devid zaghachiri Arauna, “ee, aghaghị m ịkwụzu gị ọnụahịa ya. Nʼihi na agaghị m ewere ihe bụ nke gị nye ya ONYENWE ANYị, maọbụ chụọ aja nsure ọkụ nke na-agaghị efu m ihe ọbụla.” Ya mere, Devid kwụrụ Arauna narị shekel ọlaedo isii iji zụrụ ebe ahụ. Devid wuru ebe ịchụrụ ONYENWE ANYị aja nʼebe ahụ, chụọkwa aja nsure ọkụ na aja udo. Ọ kpọkuru ONYENWE ANYị, ONYENWE ANYị zakwara ya, site nʼọkụ nke si nʼeluigwe daa nʼelu ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ. Mgbe ahụ, ONYENWE ANYị nyere mmụọ ozi ahụ iwu ka o tinyekwa mma agha ya nʼọbọ ya. Mgbe Devid hụrụ na ONYENWE ANYị azala ekpere ya nʼebe ịzọcha ọka nke Arauna onye Jebus, ọ chụkwara aja ọzọ nye ONYENWE ANYị. Ụlọ ikwu ONYENWE ANYị na ebe ịchụ aja nke aja nsure ọkụ ahụ Mosis wuru nʼọzara dị nʼebe dị elu Gibiọn, nʼoge ahụ. Ma Devid ejerughị ebe ahụ ịjụta Chineke ase, nʼihi na ụjọ tụrụ ya mgbe ọ hụrụ mma agha ahụ dị nʼaka mmụọ ozi ONYENWE ANYị.
I. IHE EMERE 21:15-30 Bible Nso (IGBOB)
Chineke we ziga mọ-ozi na Jerusalem ibibi ya: ma mb͕e ọ gaje ibibi, Jehova huru, we chègharia n'ihe ọjọ ahu, we si mọ-ozi ahu nke nēbibi, O zuwo; ub͕u a ra aka-gi. Ma mọ-ozi nke Jehova nēguzo n'akuku ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus. Devid we welie anya-ya, hu mọ-ozi nke Jehova, ka o nēguzo n'etiti ala na elu-igwe, ya na mma-agha-ya amiputara amiputa n'aka-ya, nke esetiri n'elu Jerusalem. Devid na ndi-okenye we kpuru ákwà-nkpe da kpuchie iru-ha n'ala. Devid we si Chineke, Ọ̀ bughi mu onwem siri ka aguta ndi Israel? ọbuná mu onwem ka ọ bu, bú onye mehieworo, me kwa ihe ọjọ nke-uku; ma ìgwè aturu ndia, gini ka ha mere? biko, Jehova, bú Chinekem, ka aka-Gi digidem, digide kwa ulo nnam; ma ka ọ ghara idigide ndi-Gi, ka etie ha ihe-otiti. Mọ-ozi nke Jehova we si Gad ka ọ si Devid ka Devid rigo, me ka ebe-ichu-àjà guzoro Jehova n'ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus. Devid we rigo n'okwu Gad nke o kwuru n'aha Jehova. Ọnan we chigharia, hu mọ-ozi ahu; umu-ya ndikom anọ ndi ya na ha nọ we nēzo onwe-ha. Ma Ọnan nāzọcha ọka wheat. Devid we biakute Ọnan, Ọnan we legide anya, hu Devid, si n'ebe-nzọcha-ọka-ya puta, kpọ isi ala nye Devid, kpuchie iru-ya n'ala. Devid we si Ọnan, Nyem ebe a, bú ebe-nzọcha-ọka nka, ka m'we wuere Jehova ebe-ichu-àjà nime ya: n'ego zuru ezu o ruru ka i gēnyem ya: ka ewe b͕ochie ihe-otiti a n'ebe ndi Israel nọ. Ọnan we si Devid, Were ya n'onwe-gi, ka onye-nwem, bú eze, me kwa ihe di nma n'anya-ya: le, enyewom gi ehi iji chu àjà-nsure-ọku, na ihe nzọcha-ọka ka ha buru nkú, na ọka wheat ka ọ buru onyinye-inata-iru-ọma; ihe nile ka m'nyeworo. Eze, bú Devid, we si Ọnan, É-è; kama aghaghm izuru ya n'ego zuru ezu o ruru: n'ihi na m'gaghi-ewere ihe i nwere ichuru Jehova àjà, m'gaghi-esure kwa àjà-nsure-ọku nke m'nētiyeghi ego ọ bula. Devid we nye Ọnan nnù shekel ọla-edo na ọgu iri n'ọtùtù iji zuru ebe ahu. Devid we wuere Jehova ebe-ichu-àjà n'ebe ahu, sure àjà-nsure-ọku na àjà-udo, kpọkue Jehova; Ọ we were ọku si n'elu-igwe za ya n'elu ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku. Jehova we gwa mọ-ozi ahu; o we mighachi mma-agha-ya n'ọbọ-ya. Na mb͕e ahu, mb͕e Devid huru na Jehova zara ya n'ebe-nzọcha-ọka nke Ọnan onye Jebus, o we chua àjà n'ebe ahu. Ma ebe-obibi Jehova, nke Moses mere n'ọzara, na ebe-ichu-àjà nke àjà-nsure-ọku, di n'ebe di elu nime Gibeon na mb͕e ahu. Ma Devid apughi ije n'iru ya iju Chineke ase: n'ihi na ọ turu egwu nke-uku n'ihi mma-agha mọ-ozi nke Jehova.