Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

I. IHE EMERE 13

13
1Devid we me ka ndi-isi usu nile nke nnù ndikom abua na ọgu iri na usu nile nke ọgu ndikom ise dua ya ọdu, bú onye-ndú ọ bula. 2Devid we si nkpọkọta nile nke Israel, Ọ buru na ọ di unu nma, ọ buru kwa na o sitere na Jehova, bú Chineke-ayi, ka ayi zisara umu-nne-ayi ozi n'ebe nile, bú ndi fọduru n'ala nile nke Israel, ha na ndi-nchu-àjà na ndi Livai ndi bi n'obodo ebe-ita-nri nile ha, ka ha we chikọta onwe-ha n'ebe ayi nọ: 3ka ayi bughachi kwa ib͕e Chineke-ayi n'ebe ayi nọ: n'ihi na ayi achọghi ya n'ubọchi Sọl. 4Nkpọkọta ahu nile we si na ha gēme otú a: n'ihi na okwu ahu ziri ezi n'anya ndi Israel nile. 5Devid we kpọkọta Israel nile, site na Shaihoa nke Egypt we rue nbata Hemat, ime ka ib͕e Chineke si na Kiriat-jearim bia. 6Devid we rigo, ya na Israel nile, rue Beala, rue Kiriat-jearim, nke Juda nwere, isi n'ebe ahu bugota ib͕e Chineke, bú Jehova, Onye nānọkwasi cherubim, nke akpọkwasiri Aha ahu. 7Ha we me ka ub͕ọ-ala ọhu būru ib͕e Chineke, ha we buputa ya n'ulo Abinadab: Uza na Ahio we nēdu ub͕ọ-ala ahu. 8Devid na Israel nile nēwere ike-ha nile gba egwú n'iru Chineke, were kwa abù, were kwa ubọ-akwara, na une, na egwú-otiti, na ájà, na opì. 9Ha we biarue ebe-nzọcha-ọka Kidon, Uza we setia aka-ya ijide ib͕e ahu; n'ihi na ehi nāb͕a ukwu. 10Iwe Jehova we di ọku megide Uza, O we tib͕ue ya, n'ihi na o setiri aka-ya metu ib͕e ahu: o we nwua n'ebe ahu n'iru Chineke. 11Iwe Devid we di ọku, n'ihi na Jehova tiwaputara ntiwa megide Uza: o we kpọ ebe ahu Perez-uza, rue ta. 12Devid we tua egwu Chineke n'ubọchi ahu, si, M'gēsi aṅa me ka ib͕e Chineke biakutem? 13Devid ewezugaghi kwa ib͕e ahu nye onwe-ya rue obodo Devid, ma o buzugara ya rue ulo Obed-edom, bú onye Gat. 14Ib͕e Chineke we nọdu n'ezi-na-ulo Obed-edom n'ulo-ya ọnwa atọ: Jehova we gọzie ulo Obed-edom na ihe nile o nwere.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

I. IHE EMERE 13: IGBOB

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye