Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Zekaraya 10

10
Onyenwe anyị ga-elekọta Juda
1Rịọọnụ Onyenwe anyị mmiri ozuzo nʼoge mmiri ozuzo nke ikpeazụ,
nʼihi na ọ bụ Onyenwe anyị na-ezite oke amụma mmiri.
Ọ bụ ya na-enye ụmụ mmadụ mmiri ozuzo,
na-enyekwa mmadụ niile ihe ọkụkụ nke ubi.
2Arụsị niile na-ekwu okwu aghụghọ,
ndị na-agba aja nʼahụ ọhụ bụ ụgha,
ndị ha na-arọ nrọ, na-akọwakwa nrọ ụgha,
okwu nkasiobi nke ihe na-adịghị nʼime ya ka ha na-enye.
Ya mere, ndị mmadụ na-akpagharị dịka atụrụ
a na-akpagbu ha nʼihi enweghị onye ọzụzụ atụrụ.
3“Iwe m na-ere ọkụ megide ndị ọzụzụ atụrụ,
aga m atakwa ndị ndu#10:3 Ọ bụ mkpi na-ebuta ụzọ mgbe ha na-aga nʼigwe. niile ahụhụ;
nʼihi na Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile
ga-elekọta igwe anụ ụlọ ya, ya bụ ndị Juda,
ọ ga-eme ka ha dịrị ka ịnyịnya dị ebube nʼagha.
4A ga-esi na Juda nweta nkume bụ ide ji ụlọ,#10:4 Maọbụ, nkume nkuku ụlọ
a ga-esi na ha nweta ǹtu ụlọ ikwu,
a ga-esi na ha nweta ụta a kwadoro maka agha,
sitekwa na ha nweta ndị ndu dị iche iche.
5Ha niile ga-ejikọta onwe ha ọnụ, dịka ndị bụ dike nʼagha,
ha ga-azọda ndị iro ha nʼapịtị nke okporoụzọ niile.
Nʼihi na Onyenwe anyị nọnyeere ha,
ha ga-alụgbukwa ndị iro niile na-agba ịnyịnya.
6“Aga m eme ka ụlọ Juda dị ike,
zọpụtakwa ụlọ Josef.
Aga m eme ka ha lọghachita,
nʼihi na aga m egosi ha obi ebere.
Ha ga-adị
ka ndị m na-ajụghị mgbe ọbụla,
nʼihi na mụ onwe m bụ Onyenwe anyị Chineke ha,
aga m azakwa arịrịọ ha.
7Ndị Ifrem ga-aghọ ndị dị ike nʼagha,
ha ga-enwe ọṅụ dịka ndị na-aṅụ mmanya.
Ụmụ ha ga-ahụ ya ṅụrịakwa ọṅụ,
ha ga-ejikwa obi ha niile ṅụrịa ọṅụ nʼime Onyenwe anyị.
8Mgbe ahụ, aga m akpọ ha oku,
chịkọtaa ha.
Nʼezie, aga m agbapụta ha,
ha ga-adịkwa ukwuu dịka ha dị na mbụ.
9A sịkwarị na m chụsara ha nʼetiti ndị dị iche iche,
ma ha ga-echeta m site nʼala niile ahụ dị anya.
Ha na ụmụ ha ga-adịkwa ndụ;
ha ga-alọtakwa.
10Aga m esi nʼala Ijipt kpọlata ha,
sitekwa nʼAsịrịa chịkọtaa ha.
Aga m akpọta ha na Gilead na Lebanọn.
Ha agaghị enwekwa ebe ga-ezuru ha niile.
11Ha ga-esi nʼosimiri nsogbu gafee.
A ga-emekwa ka mmali elu nke osimiri dajụọ.
Ebe obibi niile nke osimiri Naịl ga-atakọrọkwa.
A ga-egbuda mpako niile nke Asịrịa,
wezugakwa mkpara ọchịchị nke ndị Ijipt.
12Aga m eme ka ha dị ike nʼime Onyenwe anyị,
ọ bụkwa nʼaha ya ka ha ga na-ejegharị nʼudo.”
Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Zekaraya 10: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye