Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mkpughe 7

7
Ndị ozi Chineke a kara akara
1Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m ndị mmụọ ozi anọ ka ha guzo nʼakụkụ anọ nke ụwa. Ha na-egbochikwa ka ifufe ọbụla ghara ife nʼelu ala, na nʼelu osimiri, na nʼelu osisi. 2Mgbe ahụ, ahụkwara m mmụọ ozi ọzọ ka o si nʼọwụwa anyanwụ na-apụta, akara Chineke dị ndụ dịkwa nʼaka ya. O tikuru ndị mmụọ ozi anọ ahụ mkpu, bụ ndị ahụ e nyere ike imekpa ụwa ahụ, ya na oke osimiri, 3na-asị, “Unu emebila ụwa maọbụ oke osimiri maọbụ osisi ọbụla tutu ruo mgbe anyị kachara ndị ohu niile nke Chineke anyị akara nʼegedege ihu ha.” 4Mgbe ahụ anụrụ m ọnụọgụgụ ndị a kara akara ahụ, ha dị narị puku mmadụ, na iri puku mmadụ anọ na anọ, bụ ndị sitere nʼebo niile nke Izrel.
5Ndị a kara akara site nʼebo Juda dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị si nʼebo Ruben dịkwa puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị si nʼebo Gad dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
6E sitere nʼebo Asha họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị sitekwara nʼebo Naftalị dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
E sitere nʼebo Manase#7:6 Nʼebe a Manase nwa Josef, weere ọnọdụ Dan. họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
7Ndị si nʼebo Simiọn dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị sitere nʼebo Livayị dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị si nʼebo Isaka dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
8E sitere nʼebo Zebụlọn họpụta puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị si nʼebo Josef dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Ndị sikwa nʼebo Benjamin dị puku mmadụ iri na abụọ (12,000).
Oke igwe ndị yi uwe ọcha
9Mgbe ihe ndị a gasịrị, ahụrụ m oke igwe mmadụ, ndị dị ọtụtụ nʼọnụọgụgụ nke onye ọbụla na-apụghị ịgụta ọnụ. Ha sitere na mba dị iche iche na ebo dị iche iche na ndị niile na asụsụ dị iche iche, na-eguzo nʼihu ocheeze ahụ na nʼihu Nwa Atụrụ ahụ. Ha yikwasịrị onwe ha uwe ọcha, jirikwa igu nkwụ nʼaka ha. 10Ma ha ji oke olu na-eti mkpu na-asị,
“Nzọpụta dịrị Chineke anyị,
onye na-anọkwasị nʼocheeze ahụ,
dịkwara Nwa atụrụ ahụ.”
11Ndị mmụọ ozi niile ahụ guzoro ocheeze ahụ gburugburu, ha na ndị okenye ahụ na anụ anọ ahụ dị ndụ. Ha dara, kpuo ihu ha nʼala nʼihu ocheeze ahụ feekwa Chineke ofufe, 12na-asị,
“Amen!
Ngọzị niile na otuto niile,
na amamihe niile na ekele niile na nsọpụrụ niile
na ike niile na ume niile,
dịrị Chineke anyị ruo mgbe niile ebighị ebi.
Amen.”
13Mgbe ahụ, otu nʼime ndị okenye ahụ zara m sị, “Ị maara ndị ahụ, ndị a e gbokwasịrị uwe ọcha ahụ, ebee ka ha siri pụta?”
14Asịrị m, “Onyenwe m, ọ bụ gị maara.”
Ọ sịrị m, “Ndị a bụ ndị sitere nʼime oke mkpagbu ahụ pụta. Ha bụ ndị sachara uwe ha, mee ha ka ha dịrị ọcha site nʼọbara Nwa Atụrụ ahụ. 15Ọ bụ nke a mere,
“ha ji guzoro nʼihu ocheeze Chineke
na-efe ya ofufe ehihie na abalị nʼime ụlọnsọ ya.
Onye ahụ na-anọkwasị nʼelu ocheeze ahụ
ga-ekpuchikwa ha.
16‘Agụụ agaghị agụkwa ha ọzọ.
Akpịrị agaghị akpọkwa ha nkụ mgbe ọbụla.
Anyanwụ agaghị achakwa ha ọzọ,’#7:16 Aịz 49:10
okpomọkụ ọbụla agaghị erute ebe ha nọ.
17Nʼihi na Nwa Atụrụ ahụ nke nọ nʼetiti ocheeze ahụ
ga-abụ onye ọzụzụ atụrụ ha;
‘ọ ga-edurukwa ha jee nʼisi mmiri nke ndụ ahụ.’#7:17 Aịz 49:10
‘Chineke ga-ehichapụkwa anya mmiri ọbụla site nʼanya ha.’#7:17 Aịz 25:8

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Mkpughe 7: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye