Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Abụ Ọma bụ akwụkwọ nke na-atọ ọtụtụ ndị mmadụ na-agụ ya ụtọ. Ọ bụ akwụkwọ na-egosi anyị ụzọ dị iche iche ndị biri nʼọgbọ gara aga si kpọkuo Chineke nʼọnọdụ ọbụla. Anyị na-agụta ụdị abụ dị iche iche, nke ha bụrụ maka ito Chineke, maọbụ nke ha bụrụ maka ịrịọ ya mgbaghara mmehie, maọbụ nke ha bụrụ nʼoge ọṅụ maọbụ nʼoge iru ụjụ; nke ha bụrụ nʼoge okwukwe ha siri ike maọbụ nʼoge obi ha dara mba; nke ha bụrụ nʼoge ọnụma na iwe juru ha obi, maọbụ nʼoge obi ha dị jụụ. Abụ ndị ọzọ dị nʼakwụkwọ a bụ abụ e ji echeta ọrụ ukwu Chineke rụrụ nʼoge gara aga, na ọrụ nke Chineke na-arụ nʼoge ahụ ndị dere ụfọdụ nʼime Abụ Ọma dere ha. E dekwara abụ metụtara ọrụ ebube e lere anya na Chineke ga-arụ nʼoge dị nʼihu. Nʼọtụtụ ebe dị iche iche nʼime akwụkwọ Abụ Ọma a, e dere abụ gosiri nhụju anya na mmeri nke ga-adịrị Kraịst, Onye ahụ Chineke tere mmanụ.
Usoro e si dee ya:
Akwụkwọ Abụ Ọma nke mbụ 1–41
Akwụkwọ Abụ Ọma nke abụọ 42–72
Akwụkwọ Abụ Ọma nke atọ 73–89
Akwụkwọ Abụ Ọma nke anọ 90–106
Akwụkwọ Abụ Ọma nke ise 107–150

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Abụ Ọma Ihe dị nʼime ya: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye