O Chineke, ị bụ Chineke m, e ji m obi m niile na-achọ gị; akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ, anụ ahụ m na-achọsi gị ike, nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba ebe mmiri na-adịghị nʼime ya. Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị, hụkwa ike gị na ebube gị. Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ, aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma. Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị, aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị. Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ; aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị. Nʼelu ihe ndina m, ana m echeta gị, ana m atụgharị uche nʼihe banyere gị, ogologo abalị niile. Nʼihi na ị bụ onye inyeaka m, ana m abụ abụ nʼokpuru ndo nke nku gị. Mkpụrụobi m na-arapara gị nʼahụ; aka nri gị na-ejigide m.
Gụọ Abụ Ọma 63
Geere nke a ntị Abụ Ọma 63
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 63:1-8
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị