Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 25:1-22

Abụ Ọma 25:1-22 BIU

Ọ bụ na gị ONYENWE ANYị ka m tụkwasịrị obi m. O Chineke m, ọ bụ gị ka m tụkwasịrị obi m. Ekwela ka ihere mee m, ekwekwala ka ndị iro m merie m. Ihere agaghị eme onye ọbụla olileanya ya dị na gị, ma ihere ga-eme ha bụ ndị niile ịghọ aghụghọ jụrụ ahụ. O ONYENWE ANYị, zi m ụzọ gị niile, kuzikwaara m ụzọ gị niile. Duo m nʼeziokwu gị, kuzikwaara m ihe, nʼihi na ị bụ Chineke, onye Nzọpụta m, ụbọchị niile, olileanya m dị na gị. Cheta, ONYENWE ANYị, oke obi ebere na ịhụnanya gị, nʼihi na ha na-adị siterị na mgbe ochie. Echetala mmehie m mere nʼokorobịa m, ya na nnupu isi m niile. Kama site nʼịhụnanya gị cheta m, ONYENWE ANYị, nʼihi na onye dị mma ka ị bụ. Onye dị mma na onye ezi omume ka ONYENWE ANYị bụ; ọ bụ ya mere ọ na-ezi ndị mmehie ụzọ ya. Ọ na-edu ndị dị umeala nʼobi nʼụzọ ziri ezi, na-ezikwa ha ụzọ nke ya. Ụzọ niile nke ONYENWE ANYị jupụtara nʼịhụnanya na ikwesi ntụkwasị obi, nye ndị niile na-edebe iwu ọgbụgba ndụ ya. Nʼihi aha gị, O ONYENWE ANYị, gbaghara m ajọ omume m nʼagbanyeghị na ha dị ukwuu. Olee mmadụ ahụ nke na-atụ egwu ONYENWE ANYị? O ga-ezi ya ihe nʼụzọ ahụ a họpụtaara ya. Ọ ga-ebi ogologo ụbọchị nke ndụ ya nʼime ịba ụba, ndị agbụrụ ha ga-eketa ala ahụ. ONYENWE ANYị na-eme ka ndị ahụ na-atụ egwu ya mara ọgbụgba ndụ ya na izu nzuzo ya. Anya m abụọ na-elegide ONYENWE ANYị mgbe niile; nʼihi na ọ bụ naanị ya ga-eme ka ụkwụ m abụọ site nʼọnya pụta. Chee m ihu ma gosi m ebere gị, nʼihi na abụ m onye nọ na nsogbu, naanị m nọkwa. Ihe mgbu nke obi m abaala ụba, napụta m site nʼobi mwute. Lekwasị nsogbu m na ihe mgbu m anya. Biko, gbaghara m mmehie m niile. Lee ka ndị iro m si mụbaa, ha ji oke iwe kpọọ m asị. Chebe ndụ m ma gbapụta m; ekwela ka m bụrụ onye ihere ga-eme, nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ Kwere ka ezi omume na izuoke bụrụ ihe ga-agba m gburugburu, nʼihi na olileanya m dị nʼime gị. O Chineke, Gbapụtakwa Izrel, site na nsogbu ya niile.