Abụ Ọma 23
23
Abụ Ọma 23
Abụ Ọma Devid.
Onyenwe anyị na-azụ anyị dị ka atụrụ
1 Onyenwe anyị na-azụ m dịka atụrụ, ọ dịghị ihe akọrọ m.
2Ọ na-eme ka m dinaa ala nʼebe ahịhịa ndụ na-eto,
ọ na-edugharị m nʼakụkụ mmiri dị jụụ,
3ọ na-atụte mkpụrụobi m.
Ọ na-edu m nʼụzọ niile nke ezi omume
nʼihi aha ya.
4A sịkwarị na m na-aga ije,
na ndagwurugwu nke ọchịchịrị ọnwụ,
agaghị m atụ egwu ihe ọjọọ ọbụla;
nʼihi na ị nọnyeere m,
mkpọrọ gị na mkpanaka gị
na-akasị m obi.
5Ị na-akwado tebul#23:5 Nʼoge ochie, ọ bụ nʼebe iri nri (tebul) ka enyi na enyi na-anọ agba ndụ, maọbụ nwe nkwekọrịta. Oriri a na-egosi na ọgbụgba ndụ bụ ihe ọṅụ na ezi mmekọrịta nke enyi na enyi. Eze ahụ nke na-azụ ndị ya dịka atụrụ, nabatara ohu ya bụ Devid nʼebe iri nri, dịka e dere ya nʼabụ ọma a. nʼihu m,
nʼanya ndị iro m.
I tere isi m mmanụ#23:5 Mmanụ a na-ete nʼisi na-esi isi ụtọ, ọ bụ mmanụ a na-ete onye a kporo oriri iji kwanyere ya ugwu. Luk 7:46 Ndị ọzụzụ atụrụ na-ejikwa ya achụ ụmụ ahụhụ na ndanda na-achọ ịrịbanye atụrụ ndị ha na-azụ nʼimi.
iko m na-ejubiga oke.
6Nʼezie, ịdị mma na ebere ga-agbaso m
ogologo ụbọchị niile nke ndụ m,
m ga-ebikwa nʼụlọ Onyenwe anyị
mgbe niile ebighị ebi.
Nke Ahọpụtara Ugbu A:
Abụ Ọma 23: BIU
Mee ka ọ bụrụ isi
Kesaa
Mapịa
Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.
Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.
――――――
Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
Used with permission. All rights reserved worldwide.