Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 16

16
Abụ Ọma 16
Abụ miktam nke Devid.
Ekpere maka iguzosi ike
1Chebe m, O Chineke,
nʼihi na nʼime gị ka m gbabara izere ndụ.
2A gwara m Onyenwe anyị, “Ị bụ Onyenwe m,
e wezuga gị, enwekwaghị m ọdịmma ọbụla.”
3Ana m asị maka ndị nsọ bụ ndị nọ nʼala a,
“Ha bụ ndị a na-asọpụrụ, ndị ihe ha nʼatọ m ụtọ.”
4Iru ụjụ nke ndị ahụ na-agbaso chi ndị ọzọ ga-aba ụba.
Agaghị m eso ha wụsa aja ihe ọṅụṅụ ọbara#16:4 Nʼọtụtụ mba, mmanya bụ ihe e ji agọ ọfọ, ma nʼomenaala mba ụfọdụ, ọbara onye ahụ eji achụ aja ka a na-ewere gwakọọ na mmanya, wụpụ nʼebe ịchụ aja, nke ka a maara dịka aja ọbara. Ọ bụ omenaala mba ndị ahụ na-amaghị Chineke ka onye dere abụ ọma a na-emegide. Lev 18:21; Lev 20:1-2; 2Ez 16:3; 2Ez 23:10. nye chi ndị a,
maọbụ were egbugbere ọnụ m kpọọ aha ha.
5 Onyenwe anyị, i nyeela m oke m na iko m;#16:5 Iko a na-ekwu ihe banyere ya nʼebe a bụ iko a na-enye ndị akpọrọ oriri nʼoge mmemme. Dan 5:1-4
ị na-elekọta ihe niile bụ nke m site nʼife nza.
6Ọtụtụ oke ala niile dabara m nʼebe dị ezi mma;
nʼezie, e nwere m ihe nketa nke na-enye m ọṅụ.
7Aga m eto Onyenwe anyị, onye na-adụ m ọdụ;
ọ bụladị nʼabalị, obi m na-agwa m ihe m ga-eme.
8Ana m elekwasị Onyenwe anyị anya mgbe niile.
Ebe ọ nọ nʼaka nri m, agaghị m ama jijiji.
9Nʼihi nke a, obi dị m ụtọ, ire m jupụtakwara nʼọṅụ;
aga m anọkwa nʼudo.
10Nʼihi na ị gaghị ahapụ m nʼala mmụọ,
ị gaghị ekwekwa ka Onye gị kwesiri ntụkwasị obi#16:10 Maọbụ, onye gị dị nsọ hụ ire ure.
11I gosila m ụzọ ndụ;
ị ga-eji ọṅụ mejupụta obi m nʼihu gị;
ya na ihe ụtọ ndị dị nʼaka nri gị ruo ebighị ebi.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Abụ Ọma 16: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye