Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 137

137
Abụ Ọma 137
Abụ ndị a dọtara nʼagha
1Nʼakụkụ iyi niile Babilọn ka anyị nọdụrụ ala kwaa akwa
mgbe anyị chetara Zayọn.
2Ọ bụ nʼosisi pọpla
ka anyị kokwasịrị ụbọ akwara anyị niile.
3Nʼebe ahụ ka ndị dọtara anyị nʼagha gwara anyị ka anyị bụọrọ ha abụ,
ndị na-emekpa anyị ahụ rịọrọ anyị ka anyị bụọrọ ha abụ ọṅụ;
ha kwuru sị, “Bụọrọnụ anyị otu abụ nʼime abụ Zayọn!”
4Ma, olee otu anyị ga-esi bụọ abụ Onyenwe anyị
ebe anyị nọ nʼala ọzọ?
5Ọ bụrụ na m echezọọ gị, Jerusalem,
ka aka nri m chefuo ǹka ya.
6Ọ bụrụ na m echezọọ gị,
ọ bụrụkwa na m akwụsị iche echiche
banyere Jerusalem, oke ọṅụ m,
ka ire m rapara nʼokpo ọnụ m.
7Cheta, o Onyenwe anyị, ihe ndị Edọm mere
nʼụbọchị ahụ a dọtara Jerusalem nʼagha.#137:7 Mgbe Nebukadneza meriri Jerusalem, ma bibiekwa ya, ndị Edọm ṅụrịrị oke ọnụ nʼihi na ndị Izrel bụ ndị iro ha. Ma omume a ezighị ezi nʼihi na ndị Edọm na ndị Izrel bụ ụmụnna. Ndị Edọm bụ ụmụ ụmụ Ịsọ, Izk 25:12-14; Ems 1:11; Ọbd 10-14
“Tikpọsịa ya,” ka ha tiri,
“Tikpọsịa ya ruo na ntọala ya niile!”
8Gị ada Babilọn, onye a ghaghị ịla nʼiyi,
ọṅụ ga-abụ nke onye ahụ ga-akwụghachi gị ụgwọ ọrụ ruru gị
nʼihi ihe i mere anyị,
9onye ahụ ga-achịrị ụmụ gị ndị na-aṅụ ara
tụpịa ha nʼelu nkume.#137:9 Nʼoge agha, ndị meriri nʼagha na-achịkọta ụmụaka niile dị nʼobodo ahụ ha meriri, tụpịasịa ha isi na nkume. Ha na-eme nke a i ji mesie mmeri ha meriri obodo ahụ ike, nakwa i ji mee ka a ghara inwe ọgbọ ọzọ ga-ebili nʼobodo ahụ. 2Ez 8:12; Aịz 13:16; Hos 13:16; Nhu 3:10

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Abụ Ọma 137: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye