Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 133

133
Abụ Ọma 133
Abụ nrigo, nke Devid.
Ngọzị nke ibi nʼotu
1Lee ka o si bụrụ ihe dị mma
na ihe ọṅụ mgbe ụmụnne na-ebikọ nʼotu!#133:1 Hib 13:1
2Ọ dị ka mmanụ dị oke ọnụahịa a wụrụ nʼisi,
nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ,
e, nke na-asọdata ruo nʼahụọnụ Erọn,
ruokwa nʼolu uwe mwụda ya.
3Ọ dị ka a ga-asị na igirigi si na Hemon
na-ada nʼelu nʼugwu Zayọn.
Nʼihi na nʼebe ahụ ka Onyenwe anyị na-enye onyinye ngọzị ya,
ọ bụladị ndụ na-adị ruo mgbe ebighị ebi.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Abụ Ọma 133: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye