Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 131

131
Abụ Ọma 131
Abụ nrigo, nke Devid.
Abụ nke ndị dị nwayọọ nʼobi
1O Onyenwe anyị, nganga adịghị nʼobi m,
ndụ mpako abụkwaghị ọchịchọ m;
adịghị m etinye onwe m nʼokwu karịrị m
maọbụ nʼihe ndị dị ukwuu karịa m.
2Ma ana m edere duu, mkpụrụobi m nọkwa jụụ;
dịka nwantakịrị a napụrụ ara, ya na nne ya nọ,
e, dịka nwantakịrị a napụrụ ara, otu a ka mkpụrụobi m nọ nʼime m.
3Ndị Izrel, ka olileanya unu dịrị na Onyenwe anyị#131:3 Abụ 130:7
ugbu a na mgbe niile ebighị ebi.

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Abụ Ọma 131: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye