Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Abụ Ọma 119:1-16

Abụ Ọma 119:1-16 BIU

Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị ụzọ ha na-enweghị ihe ịta ụta ọbụla, ndị na-ejegharị dịka iwu ONYENWE ANYị si dị. Ndị a gọziri agọzi ka ha bụ, bụ ndị na-edebe ụkpụrụ ya ma jirikwa obi ha niile na-achọsi ya ike. Ha adịghị eme ihe ọjọọ ọbụla; ha na-ejegharị nʼụzọ ya niile. I doola ụkpụrụ ndị a ga-erubekwara isi. Ọ ga-adị m mma ma ọ bụrụ na m anọgidesie ike na-erube isi nye iwu gị niile! Mgbe ahụ, ihere agaghị eme m mgbe m tulere uche nʼiwu gị niile. Aga m eji obi ziri ezi too gị dịka m na-amụ ihe banyere iwu gị ziri ezi. Aga m erubere iwu gị niile isi; biko ahapụkwala m. Olee ụzọ nwa okorobịa ga-esi bie ndụ dị nsọ? Ọ bụ site nʼibi ndụ dịka okwu gị si dị. Eji m obi m niile na-achọsi gị ike. Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu. Ezoola m okwu gị niile nʼobi m, igbochi m imehie imegide gị. Otuto dịrị gị, o ONYENWE ANYị; kuziere m iwu gị niile. Aga m eji egbugbere ọnụ m gụgharịa iwu niile nke si nʼọnụ gị. Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niile dịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba. Ana m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị na-atulekwa uche nʼụzọ gị niile. Iwu gị na-amasị m; agaghị m elefu okwu gị anya.