Ahụrụ m ONYENWE ANYị nʼanya, nʼihi na ọ nụrụ olu m; ọ nụrụ mkpu akwa m maka ebere. Nʼihi na o gere m ntị, aga m akpọku ya oge ndụ m niile. Agbụ nke ọnwụ kekọrọ m, oke ihe mgbu nke ili bịakwasịrị m; nsogbu na iru ụjụ dakwasịrị m. Mgbe ahụ, akpọkuru m aha ONYENWE ANYị: “O ONYENWE ANYị, zọpụta m!” ONYENWE ANYị bụ onye na-eme ebere na onye ezi omume. Chineke anyị jupụtakwara nʼọmịiko. ONYENWE ANYị na-echebe ndị na-enweghị uche; mgbe m nọ nʼọnọdụ mkpa, ọ zọpụtara m. Laghachi azụ zuru ike, gị mkpụrụobi m, nʼihi na ONYENWE ANYị emesola gị mmeso ọma. Nʼihi na gị, o ONYENWE ANYị, napụtara mkpụrụobi m site nʼọnwụ, anya m site na anya mmiri akwa, napụtakwa ụkwụ m site nʼịsọ ngọngọ, ka m nwee ike jegharịa nʼihu ONYENWE ANYị nʼime ala ebe ndị dị ndụ bi. Ekwenyere m na ONYENWE ANYị mgbe m kwuru sị, “Abụ m onye nọ nʼoke nsogbu,” nʼime ịda mba m, ekwuru m sị, “Mmadụ niile bụ ndị ụgha.” Gịnị ka m ga-enyeghachi ONYENWE ANYị nʼihi mmeso ọma niile o mesoro m? Aga m eweli iko nke nzọpụta m elu kpọkuokwa aha ONYENWE ANYị. Nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ mezuo nkwa m kwere ONYENWE ANYị. Ọnwụ nke ndị nsọ ya dị oke ọnụahịa nʼanya ONYENWE ANYị. O ONYENWE ANYị, nʼezie, abụ m ohu gị; abụ m ohu gị, nwa nwoke nke ohu gị nwanyị; ị zọpụtala m site na agbụ e kere m. Aga m achụrụ gị aja ekele kpọkuokwa aha ONYENWE ANYị. Ọ bụkwa nʼihu ndị ya niile ka m ga-anọ kwụghachi ONYENWE ANYị nkwa m kwere, nʼime ogige ụlọ ONYENWE ANYị, nʼetiti gị, O Jerusalem.
Gụọ Abụ Ọma 116
Geere nke a ntị Abụ Ọma 116
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: Abụ Ọma 116:1-19
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ulo
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ
Vidiyo