Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Malakaị Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Malakaị bụ akwụkwọ ikpeazụ dị nʼagba ochie nke Baịbụlụ Nsọ. E zitere Malakaị onye amụma ka ọ bịa gbaa ndị Juu si Babilọn lọta ume nʼoge mmụọ ife na ịgbaso ụzọ Chineke malitere ịda mba. Nkwusa Malakaị kwusara metụtara mmehie dị iche iche ndị nchụaja mere, ya na ejeghị ije dị ka Chineke si chọọ ya nye mmadụ niile. O kwukwara okwu megide omume nke ịgbakụta ụlọnsọ ukwu Chineke azụ, nke dị nʼoge ahụ. O buru amụma banyere ọbịbịa nke Onye nzọpụta, bukwaa amụma banyere onye ahụ ga-ebu Onye nzọpụta ụzọ bịa idoziri ya ụzọ. Ọ kpọrọ onye ahụ Ịlaịja, ma o mesịrị pụta ìhè na ọ bụ Jọn omee baptizim ka o buru amụma ya. Nʼụzọ dị otu a, e ji olileanya banyere Onye nzọpụta nke na-abịa mechie Agba Ochie nke Baịbụlụ Nsọ.
Usoro e si dee ya:
Ịhụnanya Chineke na ndụ ọjọọ Izrel 1:1–2:9
Ekwesighị ntụkwasị obi Izrel 2:10-17
Ikpe ọmụma nke na-abịa 3:1-6
Otu ụzọ nʼụzọ iri 3:7-18
Ọbịbịa Onye nzọpụta 4

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Malakaị Ihe dị nʼime ya: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye