Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Joshua 15:20-63

Joshua 15:20-63 BIU

Nke a bụ ihe nketa ebo Juda dịka ikwu ha niile si dị. Obodo niile nke ndị ebo Juda dị na Negev, nʼakụkụ ndịda nʼoke ala Edọm bụ ndị a: Kabzeel, Eda, Jaguo, Kina, Dimona, Adada, Kedesh, Hazọ, Itnan, Zif, Telem, Bealot, Hazọ Hadata, Keriọt Hezrọn (ya bụ Hazoa), Amam, Shema, na Molada, Haza Gada, Heshmọn, Bet-Pelet, Haza Shual, Bịasheba, Biziotịa, Baala, Iyim, Ezem, Eltolad, Kesil, Homa, Ziklag, Madmanna, Sansanna, Lebaot, Shilhim, Ain na Rimọn. Ọnụọgụgụ obodo ndị a dị iri abụọ na itoolu. Obodo nta ndị ọzọ gbara ha niile gburugburu. Obodo niile ndị a dị na ndịda ugwu ka e nyekwara ebo Juda. Obodo ndị a bụ, Eshtaol, Zora, Ashna, Zanoa, En-Ganim, Tapụọa, Enam, Jamut, Adulam, Soko, Azeka, Shaaraim, Aditaịm na Gedera (maọbụ Gederotaịm). Ha niile dị obodo iri na anọ. Obodo nta ndị ọzọ gbakwara ha gburugburu. Ebo Juda ketara Zenan, Hadasha, Migdal Gad, Dilean, Mizpa, Jekteel, Lakish, Bozkat, Eglọn, Kabọn, Laamam, Kitlish, Gederọt, Bet-Dagọn, Naama na Makeda. Obodo ndị a dị iri na isii, tinyekwara obodo nta ha. Ndị Juda ketakwara: Libna, Eta, Ashan Ifta, Ashna, Nezib, Keila, Akzib na Maresha. Ha niile dị obodo itoolu, tinyekwara obodo nta ha niile. Ha ketakwara Ekrọn, na obodo nta ya niile. Ọ bụ ha nwekwa obodo niile dị nʼakụkụ ọdịda anyanwụ Ekrọn, ndị dị nso nso Ashdọd, na obodo nta niile dị ha nso. Ma Ashdọd nʼonwe ya, na ụmụ obodo nta ya niile, na Gaza na obodo nta ya niile, ruo nʼiyi Ijipt, na ruo nʼoke osimiri Mediterenịa. Ha nwetakwara ala ndị dị nʼugwu ugwu bụ, Shamia, Jatịa, Sokoh, Dana, Kiriat-Sana (ya bụ Debịa), Anab, Eshtemo, Anim, Goshen, Họlọn na Gailo, ha niile dị obodo iri na otu tinyere obodo nta ha niile. Obodo ndị ọzọ bụ Arab, Duma, Eshan, Janim, Bet-Tapụọa, Afeka, Humta, Kiriat Aba nke bụ Hebrọn na Zior, obodo itoolu tinyere obodo nta ha niile. Maon, Kamel, Zif, Juta, Jezril, na Jokdeam, Zanoa, Kain, Gibea na Timna, obodo iri tinyere obodo nta ha niile. Halhaul, Bet Zoa, Gedoa, Maarat, Bet-Anot na Eltekọn, obodo isii tinyere obodo nta ha niile. Kiriat Baal, ya bụ, Kiriat Jearim na Raba, obodo abụọ tinyere obodo nta ha niile. Obodo ha ndị dị nʼọzara bụ ndị a: Bet-Araba, Midin, Sekaka, Nibshan, Obodo Nnu na En-Gedi, obodo isii tinyere obodo nta ha niile. Ma ebo Juda enweghị ike ịchụpụ ndị Jebus bi nʼime Jerusalem; ruo taa ndị Jebus bi na Jerusalem, nʼetiti ụmụ Juda.