Job 22
22
Okwu Elifaz
1Mgbe ahụ, Elifaz onye Teman zara sị:
2“Mmadụ ọ pụrụ ịbara Chineke uru?
Ọ bụladị onye nwere uche ọ pụrụ ịbara Chineke uru?
3O nwere ọṅụ ọ ga-enye Onye pụrụ ime ihe niile ma a sị na ị bụ onye ezi omume?
Uru gịnị ka ọ ga-enweta ma ọ bụrụ na ụzọ gị niile enweghị ịta ụta?
4“Chineke ọ na-abara gị mba na-ebo gị ebubo
nʼihi na ị na-atụ egwu ya?
5Ọ bụ na mmebi iwu gị adịghị ukwuu?
Mmehie gị o nwere ọgwụgwụ?
6Ị naara ụmụnne gị ihe ebe nʼefu;
ị yipụrụ ndị mmadụ uwe ha gbawa ha ọtọ.
7I nyeghị ndị ike gwuru mmiri,
i nyeghịkwa ndị agụụ na-agụ ihe oriri.
8Ọ bụ eziokwu na ị bụ nwoke dị ike na onye nwere ala,
bụrụkwa onye a na-asọpụrụ bi nʼala ya,
9Ị na-agbaba ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, zipụ ha,
Ị na-anyaji ogwe aka nke ụmụ na-enweghị nna.
10Ọ bụ ya mere ọnya jiri gbaa gị gburugburu,
bụrụkwa ihe mbibi ji eyi gị egwu.
11Ọ bụkwa ya mere ọchịchịrị ji gbaa gị gburugburu ka ị ghara ịhụ ụzọ,
meekwa ka idee mmiri kpuchie gị.
12“Ọ bụ na Chineke anọghị nʼebe dị elu nke eluigwe?
Lee ka ịdị elu nke kpakpando dị elu si dị.
13Kama ị na-asị, ‘Gịnị ka Chineke maara?
Ọ na-esite nʼoke ọchịchịrị dị otu a ekpe ikpe?
14Oke ọchịchịrị kpuchiri ya, nke mere na ọ naghị ahụ anyị
mgbe ọ na-agagharị nʼebe dị elu nke eluigwe.’
15Ị ga-agbaso ụzọ ochie
nke ndị na-eme ihe ọjọọ zoro ije na ya?
16E bupụrụ ha tupu oge ha eruo.
Ntọala ndụ ha ka idee mmiri sachapụrụ
17Ha sịrị Chineke, ‘Hapụ anyị aka!
Gịnị ka Onye pụrụ ime ihe niile ga-eme anyị?’
18Ma ọ bụ ya ji ihe dị mma dị iche iche mejupụta ụlọ ha,
ya mere ana m ewezuga onwe m site na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu.
19Ndị ezi omume na-ahụ mbibi ndị dị otu a ma ṅụrịa;
ndị aka ha dị ọcha na-akwa ha emo sị:
20‘Nʼezie, e bibiela ndị iro anyị,
ọkụ erepịala akụnụba ha.’
21“Doo onwe gị nʼokpuru Chineke ka gị na ya nọọ nʼudo,
nʼụzọ dị otu a, ọganihu ga-abịara gị.
22Gee ntị, nabata ndụmọdụ si ya nʼọnụ,
doo okwu ya niile nʼobi gị.
23Ọ bụrụ na ịlaghachikwute Onye pụrụ ime ihe niile, ọ ga-eweghachi gị nʼọnọdụ gị;
ọ bụrụ na iwezuga ihe mmebi iwu mee ka ọ dị anya site nʼebe ụlọ ikwu gị dị,
24tọgbọ ọkpụrụkpụ ọlaedo gị nʼaja,
tụpụkwa ọlaedo nke Ọfịa gị nʼelu nkume dị nʼime ọdọ mmiri nta.
25Mgbe ahụ, Onye pụrụ ime ihe niile ga-abụrụ gị ọlaedo,
bụkwara gị ọlaọcha kachasị mma.
26Nʼezie, mgbe ahụ kwa, ihe nke Onye pụrụ ime ihe niile ga-atọ mkpụrụobi gị ụtọ,
ị ga-ewelikwa ihu gị nye Chineke.
27Ị ga-ekpe ekpere, ọ ga-azakwa gị ekpere gị,
ị ga-emezukwa nkwa i kwere.
28Ihe i kpebiri ga-emezukwa,
ìhè ga-amụkwasị nʼụzọ gị niile.
29Mgbe a na-eweda ndị mmadụ ala, ọ bụrụkwa na ị sị, ‘Bulienụ ha elu,’
mgbe ahụ ọ ga-azọpụta ndị e wedara nʼala.
30Ọ ga-azọpụta ọ bụladị onye ahụ nke aka ya na-adịghị ọcha,
bụ onye nke a ga-azọpụta site nʼịdị ọcha nke aka gị.”
Nke Ahọpụtara Ugbu A:
Job 22: BIU
Mee ka ọ bụrụ isi
Kesaa
Mapịa
Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.
Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.
――――――
Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
Used with permission. All rights reserved worldwide.