Aịzaya 2
2
Ugwu nsọ Onyenwe anyị
1Nke a bụ ihe Aịzaya nwa Emọz hụrụ banyere Juda na Jerusalem.
2Nʼụbọchị ikpeazụ,
ugwu nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, ga-abụ nke eguzobere
dịka ugwu dị elu karịa ugwu niile,
a ga-ebuli ya elu karịa ugwu nta niile,
mba niile dị iche iche ga-eruba nʼime ya dịka iyi.
3Ọtụtụ ndị mmadụ ga-abịa ma sịkwa,
“Bịanụ, ka anyị rigoruo ugwu Onyenwe anyị,
ka anyị gaa nʼụlọnsọ ukwu Chineke nke Jekọb.
Ọ ga-akụziri anyị ụzọ#2:3 Ya bụ, ụkpụrụ ya niile,
ka anyị nwe ike jee ije nʼokporoụzọ ya niile.”#2:3 Zek 8:21-23
Iwu ga-esi na Zayọn pụta,
okwu Onyenwe anyị ga-esitekwa na Jerusalem pụta.#2:3 Luk 24:47
4Ọ ga-ekpe ikpe nʼetiti mba niile,
doziekwa esemokwu dị nʼetiti ndị dị iche iche.
Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha niile mee ka ha bụrụ mma oge;
kpụgharịkwa ùbe ha mee ya ka ọ ghọọ mma ịkwacha osisi.
Mba ọbụla agakwaghị ebuli mma agha megide mba ọzọ,
maọbụ zụọ onwe ha nʼịlụ agha ọzọ.
5Unu ụlọ Jekọb, bịanụ
ka anyị na-agbaso ìhè nke Onyenwe anyị anyị.
Ụbọchị Onyenwe anyị
6Gị, bụ Onyenwe anyị, Ị gbakụtala ndị gị,
bụ ụlọ Jekọb azụ.
Nʼihi na ha jupụtara nʼikpere arụsị nke si nʼọwụwa anyanwụ.
Ha na-ajụkwa ase dịka ndị Filistia.
Ha na ndị na-ekpere arụsị na-ejikọkwa aka.
7Ala ha jupụtara nʼọlaọcha na ọlaedo,
ha bara ụba nke ukwuu.
Ala ha jupụtara nʼịnyịnya.
Ụgbọ agha ha dịkwa ukwuu.
8Ala ha jupụtara nʼarụsị,
ha na-akpọ isiala nye ihe ndị ahụ ha ji aka ha kpụọ,
ihe ndị ahụ mkpịsịaka ha kpụrụ.
9Nʼihi ya, a ga-eme ka mmadụ bụrụ ihe e wedara nʼala,
meekwa ka mmadụ niile bụrụ ndị e wedara nʼala.
Ya mere, agbagharala ha.
10Gaanụ nʼime nkume,
zoonụ nʼime ala nʼihi ihe egwu si nʼebe Onyenwe anyị,
na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya.
11Anya nke onye nganga ka a ga-eweda nʼala,
mpako nke ndị mmadụ ka a ga-ewedakwa nʼala.
Ọ bụ naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ.
12 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, nwere ụbọchị ọ kwadooro
nye ndị mpako na ndị na-ebuli onwe ha elu,
nʼihi na ihe niile e buliri elu
(ka a ga-eweda nʼala),
13nye osisi sida niile topụrụ ogologo ma maa mma nke Lebanọn,#2:13 Lebanọn bụ obodo dị nʼakụkụ ọwụwa anyanwụ osimiri Jọdan. Ihe e ji mara obodo a bụ osisi ook na-eto nʼebe ahụ na ehi Zek 11:1-2
na osisi ook niile nke Bashan,
14nye ugwu ukwu niile nke dị elu,
na ugwu nta niile e buliri elu,
15nye ụlọ elu niile,
na mgbidi niile e wusiri ike,
16nye ụgbọ mmiri niile e ji azụ ahịa,#2:16 Ụgbọ niile nke Tashish
na ụgbọ mmiri ndị ọzọ niile buru ibu maa mma.
17Onye nganga ka a ga-eweda nʼala,
mpako nke ndị mmadụ niile ka a ga-eweda nʼala.
Naanị Onyenwe anyị ka a ga-ebuli elu nʼụbọchị ahụ.
18A ga-ala arụsị niile nʼiyi, mee ka ha ghara ịdịkwa.
19Ndị mmadụ ga-agba ọsọ gbaba nʼọnụ dị na nkume,
na nʼọnụ e gwuru nʼala,
nʼihi egwu Onyenwe anyị,
na nʼihi ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya,
mgbe ọ ga-ebili ịyọgharị ụwa.
20Nʼụbọchị ndị ahụ,
ha ga-atụfusị arụsị ọlaedo na nke ọlaọcha ha kpụrụ,
nke ha kpụrụ ma na-efe,
hapụrụ ha ụmụ oke, na ụmụ ụsụ.
21Mgbe ahụ, ha ga-ezo onwe ha nʼoghere niile dị nʼoke nkume,
na nʼime ọgba niile nke oke nkume
nʼihi ịgbanarị iwe ọkụ Onyenwe anyị,
na ịma mma ebube nke ịdị ukwuu ya,
mgbe o biliri ịyọgharị ụwa.
22Kwụsị ịtụkwasị mmadụ efu obi.
O nweghị ihe ọ bụ karịa naanị nkuume ahụ dị ya nʼime,
nʼihi gịnị ka e ji agụnye ya?
Nke Ahọpụtara Ugbu A:
Aịzaya 2: BIU
Mee ka ọ bụrụ isi
Kesaa
Mapịa
Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.
Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.
――――――
Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
Used with permission. All rights reserved worldwide.