Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Aịzaya 16

16
1Ziganụ ụmụ atụrụ dịka onyinye
nye onye na-achị ala ahụ
site na Sela, gafee nʼụzọ ọzara
ruo ugwu nke Ada Zayọn.
2Ndị inyom Moab
nọkwa nʼọnụ mmiri Anọn#16:2 Mmiri Anọn nke dị nʼakụkụ ugwu oke ala ahụ, bụ iyi dị mkpa nʼala Moab Ọnụ 21:13-14
na-akwụgharị
dịka ụmụ nnụnụ e si nʼakwụ ha chụpụ.
3Moab na-asị, “Nwee mkpebi na mmụọ gị,”
“Kwubie okwu nʼihe ị kpebiri.
Mee ka onyinyo gị dịrị ka abalị
nʼetiti oke ehihie.
Zobe ndị gbapụrụ ọsọ ndụ,
ekpugheela onye na-achọ ebe nchebe.
4Ka ndị Moab achụpụrụ achụpụ nọrọ nʼetiti unu,
ghọrọ ha ebe nchebe pụọ nʼaka onye mbibi ahụ.”
Onye mmegbu ahụ nwere ọgwụgwụ,
mbibi ga-akwụsịkwa,
onye ahụ na-azọda mmadụ ga-agwụchakwa site nʼala ahụ.
5A ga-ehiwe otu ocheeze site nʼịhụnanya;
otu nwoke ga-anọkwasị nʼelu ya site nʼikwesị ntụkwasị obi,
otu onye sitere nʼụlọ ikwu Devid,
bụ, onye mgbe ọ na-ekpe ikpe, na-achọ ikpe ziri ezi,#16:5 Aịz 9:6-7; Aịz 32:1; Dan 7:14; Luk 1:33; Mkp 11:15
na-emekwa ngwa ime ezi omume.
6Anyị anụla akụkọ banyere Moab,
nụkwa ihe banyere nganga#16:6 Jer 48:29; Ọbd 3; Zef 2:8 ya na aghụghọ ya niile.
Obodo ahụ na-anya isi, nke nganga juru obi?
Ugbu a, lee na ịnya isi ha erijughị afọ.
7Ya mere, ndị Moab niile na-eti mkpu akwa,
ha na-ebetara Moab akwa.
Kwasie akwa ike, nwee mwute,
nʼihi achịcha e ji mkpụrụ osisi a mịkpọrọ amịkpọ mee nke Kia Hereset.
8Lee ka ubi niile nke Heshbọn si tọgbọrọ nʼefu;
osisi vaịnị ha niile dị na Sibma akpọnwụsịala.
E, ndị eze mba dị iche iche azọdala
ọtụtụ osisi vaịnị ọma ndị a niile nʼụkwụ.
E, osisi vaịnị ndị gbatịrị ruo Jeza,
ruokwa nʼọzara,
nke mgbọrọgwụ ha gbasara
ruo nʼọnụ osimiri.
9Nʼihi ya, ana m akwa akwa dị ka ndị Jeza#16:9 Aịz 15:4 si akwa akwa
nʼihi ubi vaịnị Sibma.
Anya mmiri akwa m ga-ede gị ahụ
gị Heshbọn, na gị Eleale,#16:9 Ọnụ 32:3; Jer 48:34
nʼihi na e meela ka ụzụ mkpu ọṅụ nke na-ada
mgbe a na-ewe ihe ubi nʼime gị gharakwa ịdị ọzọ.
10Ewepụla ọṅụ na obi ụtọ site nʼubi na-amị mkpụrụ ọma,
ọ dịghị onye na-abụ maọbụ tie mkpu ọṅụ nʼubi vaịnị a gbara ogige;
ọ dịkwaghị onye na-azọchapụta mmanya m vaịnị nʼebe ịzọcha mmanya;
nʼihi na emeela m ka iti mkpu ọṅụ niile kwụsị.
11Mkpụrụobi m na-enwe mwute nʼihi Moab dịka ụbọ akwara,
ime mmụọ m kwa nʼihi Kia Heres.
12Mgbe Moab ga-egosipụta onwe ya nʼebe ya dị elu,
ọ na-eme naanị ka ike gwụ ya,
mgbe ọ ga-aga ikpe ekpere nʼihu mmụọ ya,
o nweghị uru nke a ga-abara ha.
13Ihe ndị a niile bụ okwu Onyenwe anyị kwuru banyere Moab na mbụ, 14ma ugbu a Onyenwe anyị na-ekwu, sị, “Tupu afọ atọ agachaa, dịka onye e goro ọrụ#16:14 Job 7:1; 14:6; Aịz 21:16 si agụ afọ, a ga-eleli ugwu niile Moab nwere, ya na igwe mmadụ ya bara ụba. Ndị fọdụkwara ndụ ga-adị naanị mmadụ ole na ole bụrụkwa ndị na-adịghị ike.”

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

Aịzaya 16: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye