Ndị Hibru Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
E nweghị nkwekọrịta nʼetiti ndị ọkachamara akwụkwọ nsọ banyere onye dere akwụkwọ a. Ma ọtụtụ kwenyere na ọ bụ Pọl dere ya. Ihe e bu nʼuche dee akwụkwọ a bụ Jisọs Kraịst. E gosiri ndị Juu nʼakwụkwọ a na ọbịbịa Kraịst bịara emeela ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị nʼetiti Chineke na mmadụ. E gosikwara na ọgbụgba ndụ ọhụrụ a dị mma karịa ọgbụgba ndụ ochie. Site nʼọgbụgba ndụ ọhụrụ a mmadụ nwere ike ugbu a ịbịaru Chineke nso, nʼihi na ọbịbịa Kraịst emeela ka usoro ọchụchụ aja nke ọgbụgba ndụ ochie ahụ bụrụ ihe e wezugara ewezuga. Ịdọ aka na ntị dị iche iche dịkwa nʼakwụkwọ a banyere nnupu isi na ekweghị ekwe.
Usoro e si dee ya:
Ịdị ukwuu Kraịst 1–3
Ndụ ọhụrụ onye Kraịst nwere 4:1-13
Onyeisi nchụaja ọhụrụ 4:14–8:13
Ọgbụgba ndụ ọhụrụ 9–10
Ndị mgbe ochie na okwukwe ha 11
Ndụmọdụ banyere obibi ndụ onye Kraịst 12:1–13:19
Okwu mmechi 13:20-25
Nke Ahọpụtara Ugbu A:
Ndị Hibru Ihe dị nʼime ya: BIU
Mee ka ọ bụrụ isi
Kesaa
Mapịa
Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a™
Ndị Biblica, Inc. degharịrị ya nʼafọ © 1980, 1988, 2019, 2020
Ọ bụ ndị Biblica, Inc. nyere ikike idenye amaokwu ndị a.
Ikike a dị nye ndị Biblica, Inc. nʼụwa niile.
――――――
Igbo Contemporary Bible™
Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc.
Used with permission. All rights reserved worldwide.