Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

2 Samuel Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Akụkọ a kọrọ nʼakwụkwọ a bụ akụkọ gbasara ọchịchị Devid dị ka eze Izrel. E bidoro akụkọ a site na mmalite mgbe e mere Devid eze. A kọkwara ihe gbasara otu Devid siri merie ndị niile chọrọ imegide ọnọdụ ịbụ eze ya. Deekwa otu Jerusalem si ghọọ isi obodo Izrel, na otu e si bubata igbe ọgbụgba ndụ nʼebe ahụ; na otu e si merie ndị Filistia nʼagha. A kọkwara akụkọ banyere nsogbu Devid nwere nʼoge ọ bụ eze, dị ka akụkọ nnupu isi Absalọm, na akụkọ mmehie ịkwa iko nke Devid mere. E ji akụkọ metụtara ọnọdụ Devid mgbe ọ ghọrọ agadi, mechie ihe e dere nʼakwụkwọ a.
Usoro e si dee ya:
Ihe dị iche iche Devid mere mgbe e mere ya eze 1–5
Mmeri Devid meriri ndị Filistia 6–11
Mmehie Devid na ịba mba Netan 12:1-25
Nsogbu bịakwasịrị Devid 12:26–21:22
Abụ otuto Devid 22:1–23:7
Nsogbu ndị ọzọ Devid nwere 23:8–24:25

Nke Ahọpụtara Ugbu A:

2 Samuel Ihe dị nʼime ya: BIU

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye