Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

1 Ndị Kọrint Ihe dị nʼime ya

Ihe dị nʼime ya
Ihe dị nʼime ya:
Ọ bụ site na nkwusa Pọl ka e ji malite chọọchị dị na Kọrint. Ma mgbe Pọl mesiri si nʼetiti ha pụọ ikwusa oziọma nʼebe ọzọ, ndị nọ na chọọchị a malitere ibi ndụ nke na-ekwesighị ndị Kraịst. Esemokwu, enweghị ịhụnanya, ozizi ụgha dị iche iche, aghara, na mmehie ịkwa iko jupụtara nʼetiti ha. Nʼihi nke a Pọl deere ha akwụkwọ a ịdụ ha ọdụ banyere ihe ọjọọ ndị a ha na-eme, na igosi ha ihe bụ uche Chineke banyere ibi ezi ndụ nke ndị Kraịst.
Usoro e si dee ya:
Ekele mmalite 1:1-9
Nsogbu nke adịghị nʼotu 1:10–4:21
Nsogbu nke ịkwa iko 5
Nsogbu nke okwu na ụka 6:1-11
Nsogbu nke ịchụ nwanyị na iso nwoke 6:12-20
Ozizi banyere ọlụlụ di na nwunye 7
Ozizi banyere nri dị iche iche 8:1–11:1
Ozizi banyere ezi okpukpe 11:2–14:40
Ozizi banyere mbilite nʼọnwụ 15
Ekele ikpeazụ 16

Mee ka ọ bụrụ isi

Kesaa

Mapịa

None

Ịchọrọ ka echekwaara gị ihe ndị gasị ị mere ka ha pụta ìhè ná ngwaọrụ gị niile? Debanye aha gị ma ọ bụ mee mbanye