1
I. NDI-EZE 3:9
Bible Nso
Ma nye orù-Gi obi nānu ihe ikpe ndi-Gi ikpe, ighọta ihe di iche n'etiti ezi ihe na ihe ọjọ; n'ihi na ònye puru ikpe ndi-Gi nka di arọ́ ikpe?
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa I. NDI-EZE 3:9
2
I. NDI-EZE 3:12
le, emewom dika okwu-gi si di: le, enyewom i obi mara ihe na nke nāghọta ihe; ya mere ọ dighi onye dika gi buru gi uzọ nọ, ọ dighi kwa onye gēbili dika gi n'azu gi.
Nyochaa I. NDI-EZE 3:12
3
I. NDI-EZE 3:11
Chineke we si ya, N'ihi na i riọrọ ihe a, ma i riọghi nye onwe-gi ọtutu ubọchi; i riọghi kwa àkù nye onwe-gi, i riọghi kwa ndu ndi-iro-gi; kama i riọworo onwe-gi nghọta inu ikpé
Nyochaa I. NDI-EZE 3:11
4
I. NDI-EZE 3:13
Ọzọ kwa, enyewom i ihe i nāriọghi, ma àkù ma nsọpuru, ya mere ọ dighi nwoke ọ bula n'etiti ndi-eze gādi ka gi ubọchi-gi nile.
Nyochaa I. NDI-EZE 3:13
5
I. NDI-EZE 3:14
Ọ buru kwa na i je ije n'uzọm nile, idebe ukpurum nile na ihe nile M'nyere n'iwu dika nna-gi, bú Devid, jere, M'gēme kwa ka ubọchi-gi di ogologo.
Nyochaa I. NDI-EZE 3:14
6
I. NDI-EZE 3:5
Na Gibeon ka Jehova mere ka Solomon hu Ya anya na nrọ nke abali: Chineke we si, Riọ ihe M'gēnye gi.
Nyochaa I. NDI-EZE 3:5
7
I. NDI-EZE 3:7
Ma ub͕u a, Jehova, bú Chinekem, Gi onwe-gi emewo orù-Gi eze n'ọnọdu Devid, bú nnam: ma mu onwem bu nwatakiri; amaghm ipu apu na ibata abata.
Nyochaa I. NDI-EZE 3:7
8
I. NDI-EZE 3:10
Okwu-ya we di nma n'anya Onye-nwe-ayi, na Solomon riọrọ ihe a.
Nyochaa I. NDI-EZE 3:10
9
I. NDI-EZE 3:6
Solomon we si, Gi onwe-gi emeworo orù-Gi, bú Devid nnam, ebere uku, dika o jere ije n'iru Gi n'ezi-okwu na n'ezi omume, na nime obi ziri ezi n'ebe I nọ; I we debere ya ebere uku a, nye ya nwa-nwoke nke nānọkwasi n'oche-eze-ya, dika ọ di ta.
Nyochaa I. NDI-EZE 3:6
10
I. NDI-EZE 3:8
Orù-Gi nọ kwa n'etiti ndi-Gi I rọputaworo, ndi bara uba, ndi anādighi-aguta ha, ndi anādighi-agu kwa ha ọnu, n'ihi iba-uba-ha.
Nyochaa I. NDI-EZE 3:8
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị