1
Abụ Ọma 32:8
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Aga m eme ka ị nwee uche, zikwa gị ụzọ i kwesiri ịgbaso; Aga m adụ gị ọdụ, anya m ga-adịkwasịkwa nʼahụ gị.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Abụ Ọma 32:8
2
Abụ Ọma 32:7
Gị onwe gị bụụrụ m ebe nzuzo; Ị ga-echebekwa m ka nsogbu ọbụla hapụ irute m nso. Ọ bụkwa abụ nzọpụta ka i ji gbaa m gburugburu. Sela
Nyochaa Abụ Ọma 32:7
3
Abụ Ọma 32:5
Mgbe ahụ, ekwupụtara m mmehie m niile nʼihu gị, kwụsịkwa izo ha ezo. Agwara m onwe m okwu sị, “Aga m ekwupụta mmehie m niile nʼihu ONYENWE ANYị.” Ị gbaghakwaara m ikpe ọmụma nke mmehie m niile. Sela
Nyochaa Abụ Ọma 32:5
4
Abụ Ọma 32:1
Onye a gọziri agọzi ka mmadụ ahụ bụ, onye a gbaghaara ajọ omume ya niile, onye e kpuchikwaara mmehie ya niile.
Nyochaa Abụ Ọma 32:1
5
Abụ Ọma 32:2
Ngọzị na-adịrị nwoke ahụ, onye ONYENWE ANYị na-adịghị agụnyere mmehie ya, onye ahụ nke aghụghọ ọbụla na-adịghịkwa nʼime mmụọ ya.
Nyochaa Abụ Ọma 32:2
6
Abụ Ọma 32:6
Ya mere, ka ndị niile bụ ndị ezi omume kpọkuo gị nʼekpere mgbe e nwere ike ịchọta gị; nʼụzọ dị otu a, ọ bụrụ na uju mmiri abịa, ọ gaghị erute ha.
Nyochaa Abụ Ọma 32:6
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị