1
Ilu 22:6
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Kuziere nwantakịrị ka ọ họrọ ụzọ ziri ezi, mgbe o tolitere ọ ga-anọgide nʼime ya.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Ilu 22:6
2
Ilu 22:4
Obi umeala bụ egwu ONYENWE ANYị, ụgwọ ọ na-akwụ bụ akụnụba, na nsọpụrụ na ndụ ogologo.
Nyochaa Ilu 22:4
3
Ilu 22:1
Ihe nhọrọ dị ezi mma ka aha ọma bụ karịa ọtụtụ akụ, ịnata amara ihuọma ka mma karịa ọlaọcha na ọlaedo.
Nyochaa Ilu 22:1
4
Ilu 22:24
Gị na onye na-ewe oke iwe abụla enyi, gị na onye na-ewe iwe ọsịịsọ emekọkwala ihe
Nyochaa Ilu 22:24
5
Ilu 22:9
Onye na-agbasapụ aka enye onyinye ga-abụ onye a gọziri agọzi, nʼihi na ha na ekenyetụ ndị ogbenye nri.
Nyochaa Ilu 22:9
6
Ilu 22:3
Onye nwere uche na-ahụ nsogbu nke na-abịa nʼihu ma zobe onwe ya, ma onye na-enweghị uche anaghị ele anya, ọ na-adaba nʼime nsogbu ahụ taa ahụhụ so ya.
Nyochaa Ilu 22:3
7
Ilu 22:7
Dịka ọgaranya si achị ogbenye, otu a kwa ka onye na-ebi ego si bụrụ ohu onye na-ebinye ya ego.
Nyochaa Ilu 22:7
8
Ilu 22:2
Ma ogbenye ma ọgaranya bụ otu nʼihu ONYENWE ANYị onye kere ha niile.
Nyochaa Ilu 22:2
9
Ilu 22:22-23
Emegbula ogbenye nʼihi na ọ bụ ogbenye. Emegidekwala ya nʼụzọ ikpe. Nʼihi na ONYENWE ANYị ga-ekwuchitere ha ọnụ ha ma bibiekwa ndị na-emegide ha.
Nyochaa Ilu 22:22-23
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị