Ma ọ bụrụ na ONYENWE ANYị emee ihe ọhụrụ dị iche, mee ka ala meghee ọnụ ya, lodaa ndị a niile, na ihe niile bụ nke ha, si otu a mee ka ha rịda nʼala ili na ndụ, mgbe ahụ, unu ga-amata na ndị ikom ndị a eledala ONYENWE ANYị anya.”
Mgbe Mosis kpụ okwu a nʼọnụ ya, lee ala ahụ Kora, na Datan, na Abiram, na ndị ezinaụlọ ha niile guzo nʼelu ya kewara abụọ nʼotu ntabi anya ahụ, ala ahụ meghere ọnụ ya, loo ha, na ezinaụlọ ha niile, na ndị ahụ niile so Kora, na ihe niile ha nwere.