ỌNU-ỌGUGU 16:30-32
ỌNU-ỌGUGU 16:30-32 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Ma ọ bụrụ na ONYENWE ANYị emee ihe ọhụrụ dị iche, mee ka ala meghee ọnụ ya, lodaa ndị a niile, na ihe niile bụ nke ha, si otu a mee ka ha rịda nʼala ili na ndụ, mgbe ahụ, unu ga-amata na ndị ikom ndị a eledala ONYENWE ANYị anya.” Mgbe Mosis kpụ okwu a nʼọnụ ya, lee ala ahụ Kora, na Datan, na Abiram, na ndị ezinaụlọ ha niile guzo nʼelu ya kewara abụọ nʼotu ntabi anya ahụ, ala ahụ meghere ọnụ ya, loo ha, na ezinaụlọ ha niile, na ndị ahụ niile so Kora, na ihe niile ha nwere.
ỌNU-ỌGUGU 16:30-32 Bible Nso (IGBOB)
Ma ọ buru na ihe-òkìkè ọhu ka Jehova gēkè, ala ewe saghepu ọnu-ya, loda ha, ha na ihe nile ha nwere, ha we rida na ndu rue ala-mọ; unu gāmara kwa na ndikom ndia elelìwo Jehova. O rue, mb͕e o kwubiri okwu ndia nile, na ala nke di n'okpuru ha b͕awara: ala we saghe ọnu-ya, loda ha, na ulo nile ha, na madu nile Kora nwere, na àkù-ha nile.