1
Levitikọs 19:18
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
“ ‘Abọla ọbọ, ebukwala iro nʼobi megide onye ọbụla nʼetiti ndị gị. Kama hụ onye agbataobi gị nʼanya dịka i si hụ onwe gị nʼanya. Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị unu.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Levitikọs 19:18
2
Levitikọs 19:28
“ ‘Unu akala ihe ọbụla nʼahụ unu, nʼihi onye nwụrụ anwụ maọbụ jiri mma ọkụ dee ihe nʼahụ unu. Abụ m ONYENWE ANYị.
Nyochaa Levitikọs 19:28
3
Levitikọs 19:2
“Gwa ọgbakọ ụmụ Izrel niile okwu sị ha: ‘Dịnụ nsọ, nʼihi na mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị bụ Chineke unu, dị nsọ.
Nyochaa Levitikọs 19:2
4
Levitikọs 19:17
“ ‘Akpọla nwanne gị asị nʼime obi gị. Tụọ onye agbataobi gị mmehie ya nʼihu ya, ka ị ghara iketa oke nʼikpe ọmụma dịrị ya.
Nyochaa Levitikọs 19:17
5
Levitikọs 19:31
“ ‘Unu ejekwurula ndị na-ajụ mmụọ ọjọọ ase maọbụ chọgaa ndị dibịa afa, nʼihi na unu ga-emerụ onwe site na ha. Mụ onwe m bụ ONYENWE ANYị Chineke unu.
Nyochaa Levitikọs 19:31
6
Levitikọs 19:16
“ ‘Unu ejegharịla na-agbasa okwu nkwujọ nʼetiti ndị mmadụ. “ ‘Emela ihe ọbụla ga-ebutere onye agbataobi gị ọnwụ. Abụ m ONYENWE ANYị.
Nyochaa Levitikọs 19:16
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị