Okwu ONYENWE ANYị nke ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere ndị Filistia. Okwu ndị a bịara tupu Fero ebuso obodo Gaza agha.
Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị kwuru,
“Lee ka mmiri si ala elu nʼakụkụ ugwu;
ha ga-aghọkwa mmiri nke na-erubiga oke.
Ha ga-erukwasị ala ahụ, kpuchiekwa ihe niile dị nʼime ya,
ọ ga-ekpuchikwa obodo niile dị nʼala ahụ, na ndị bi nʼime ya.
Ndị niile bi nʼala ahụ ga-eti mkpu akwa,
mmadụ niile ga-akwasikwa akwa ike.