JEREMAIA 47:1-2
JEREMAIA 47:1-2 Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a (BIU)
Okwu ONYENWE ANYị nke ruru Jeremaya onye amụma ntị banyere ndị Filistia. Okwu ndị a bịara tupu Fero ebuso obodo Gaza agha. Ihe ndị a ka ONYENWE ANYị kwuru, “Lee ka mmiri si ala elu nʼakụkụ ugwu; ha ga-aghọkwa mmiri nke na-erubiga oke. Ha ga-erukwasị ala ahụ, kpuchiekwa ihe niile dị nʼime ya, ọ ga-ekpuchikwa obodo niile dị nʼala ahụ, na ndị bi nʼime ya. Ndị niile bi nʼala ahụ ga-eti mkpu akwa, mmadụ niile ga-akwasikwa akwa ike.
Kesaa
Gụọ JEREMAIA 47JEREMAIA 47:1-2 Bible Nso (IGBOB)
Okwu Jehova nke ruru Jeremaia, bú onye-amuma, nti bayere ndi Filistia, tutu Fero etib͕ue Geza. Otú a ka Jehova siri: Le, miri nēsi n'Ugwu erú, ha gāghọ kwa miri-iyi nērubiga ókè, ha gērusa kwa ala na ùjú-ya, na obodo na ndi bi nime ya: madu ewe tie nkpu, ndi nile bi n'ala ahu gākwasi kwa ákwá ike.
Kesaa
Gụọ JEREMAIA 47