1
Aịzaya 11:2-3
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Mmụọ ONYENWE ANYị ga-enwekwa ọnọdụ nʼime ya, inye ya Mmụọ amamihe na Mmụọ nghọta, Mmụọ ndụmọdụ na ike, Mmụọ ihe ọmụma na nke ịtụ egwu ONYENWE ANYị. Ihe ga-amasị ya bụ egwu ONYENWE ANYị.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa Aịzaya 11:2-3
2
Aịzaya 11:1
Ome ga-epupụta site nʼogwe osisi Jesi; otu Alaka ga-esitekwa na mgbọrọgwụ ya tolite ga-amịkwa mkpụrụ.
Nyochaa Aịzaya 11:1
3
Aịzaya 11:4
Kama ọ bụ ezi omume ka ọ ga-eji kpee ndị ogbenye ikpe; ọ bụkwa ikpe ziri ezi ka ọ ga-ekpere ndị na-adịghị ike nke ụwa. Okwu ọnụ ka ọ ga-eji nye ndị mmadụ ahụhụ, ọ bụ okwu ọnụ ka ọ ga-eji maa ndị ajọ omume ikpe ọnwụ.
Nyochaa Aịzaya 11:4
4
Aịzaya 11:5
Ezi omume ya ga-adị ka ihe ike nʼume, ma ikwesi ntụkwasị obi ga-abụ ihe okike ukwu ya.
Nyochaa Aịzaya 11:5
5
Aịzaya 11:9
Ha agaghị eme ihe mmerụ maọbụ bibikwa ihe, nʼelu ugwu nsọ m niile. Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke ONYENWE ANYị dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri.
Nyochaa Aịzaya 11:9
6
Aịzaya 11:6
Nʼụbọchị ahụ, nkịta ọhịa na nwa atụrụ ga-ebikọ nʼudo; agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa. Nwa ehi na ụmụ ọdụm na nwa ịnyịnya mara abụba ga-anọkọtakwa, ọ bụkwa nwantakịrị ga na-edugharị ha.
Nyochaa Aịzaya 11:6
7
Aịzaya 11:10
Nʼụbọchị ahụ, mgbọrọgwụ Jesi ga-eguzo ka ọkọlọtọ nye ndị dị iche iche. Mba niile ga-abịakwute ya; ebe izuike ya ga-ejupụtakwa nʼebube.
Nyochaa Aịzaya 11:10
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị