Ahụrụ ihe ọzọ nʼokpuru anyanwụ,
ọ bụghị ndị nwere ụkwụ ọsọ na-agbata ihe,
ọ bụkwaghị onye sikarịrị ike na-emeri nʼagha;
ọ bụghị ndị maara ihe ka nri dịrị,
ọ bụghị ndị nwere nghọta ka akụnụba dịrị,
ọzọkwa, ọ bụghị ndị nka ka amara na-adịrị;
kama ọ bụ mgbe na ihe ndaba na-eme ka ihe ndị a dịrị.