Ma eze zaghachiri Arauna, “Ee, aghaghị m ịkwụzu gị ụgwụ ya, nʼihi na agaghị m achụrụ ONYENWE ANYị, bụ Chineke m aja nsure ọkụ nke na-agaghị efu m ihe ọbụla.”
Ya mere, Devid zụrụ ebe ịzọcha ọka ahụ na ehi ahụ niile, kwụọ Arauna iri shekel ọlaọcha ise, nʼihi ha.