1
1 Ihe E Mere 29:11
Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a
Gị onwe gị, ONYENWE ANYị nwe ịdị ukwu, na ike, na ịma mma, na ugwu eze, na ebube, nʼihi na ihe niile nʼeluigwe na nʼụwa bụ nke gị. Gị onwe gị, ONYENWE ANYị nwe alaeze. Gị kwa ka e buliri elu dịka onye na-achị isi nʼelu ihe niile.
Lee anya n'etiti ihe abụọ
Nyochaa 1 Ihe E Mere 29:11
2
1 Ihe E Mere 29:12
Akụnụba na nsọpụrụ na-esite nʼebe ị nọ abịa. Gị onwe gị na-achịkwa ihe niile. Ọ bụkwa nʼaka gị ka ume na ike dị ibuli ihe niile elu, na inye ihe niile ike.
Nyochaa 1 Ihe E Mere 29:12
3
1 Ihe E Mere 29:14
“Ma onye ka m bụ, ole ndị kwa ka ụmụ Izrel bụ, na i kweere ka anyị gbasapụ aka anyị nye gị onyinye. Ihe niile anyị nwere sitere nʼaka gị bịa, ha kwa ka anyị na-enyeghachi gị.
Nyochaa 1 Ihe E Mere 29:14
4
1 Ihe E Mere 29:13
Ugbu a, Chineke anyị, anyị na-enye gị ekele na-etokwa aha gị dị ebube.
Nyochaa 1 Ihe E Mere 29:13
5
1 Ihe E Mere 29:10
Nʼihu ọha Izrel niile, Devid kelere ONYENWE ANYị ekele sị, “Otuto dịrị gị ONYENWE ANYị Chineke nna anyị Izrel site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi.
Nyochaa 1 Ihe E Mere 29:10
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị