Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara NDI ROM 5:3
Okwukwe
Ụbochị Iri abụa
Ọbụ ahụ na anya ekwere? K'ọbụ ekwere, ahụ na anya? Ihe ndia bụ ajụjụ okwukwe. Atụmatụ a n'enye ihe omụmụ dị omimi nke okwukwe-sitere na akụkọ ndi mmadu di ire nke edere na agba ochie, ndi gosiri okwukwe obi ike mgbe ihe agaghi ekwe omume biakutere ha; we ruo na nkuzi Jesọs n'isiokwu a. Site na ihe ọgụgụ gi a, iga enweta agbamume iga omimi nime nmekorita gi na Chineke ka iwe bụrụ kwue onye kwesịrị ntụkwasị obi na eso ụzọ Jesọs.
Mmetụta Uche Di Nsọ - Azịza Akwụkwọ Nsọ Nye Ihe Ịma Aka Ọbụla
Ụbọchị Iri ato
Chineke kere gị ma tinye gị n'oge a, ịhụ n'anya ndị a na-ekwesighị ihụ n'anya, igosipụta udo n'ọgba aghara, na imuke ọñụ a na-enweghị ike imenyu n'ọnọdụ ọ bụla. Nke a nwere ike ịdị ka ihe na-agaghị ekwe omume, ma ị pụrụ ime nke a site n’ịmụ ihe Akwụkwọ Nsọ nwere ikwu banyere mmetụta uche mmadụ gị sitere n’okike na otú ị ga-esi jikwaa ha. Ihe omumu ofufe a na-akuzi gbasara ihe ịma aka di mfe na ụfọdụ nke pụrụ iche anyị n'otu n'otu na-ebu agha kwa ụbọchị, ma na-enye ntụaka nke Akwụkwọ Nsọ otu ị ga-esi jikwaa mmetụta uche gị n'ụzọ nke Chineke. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/255 https://my. bible. com/reading-plans/255-holy-emotions/day/1.