Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara ABÙ ỌMA 51:7

Òmùmé-Gasị Nke Nchegharị
Ụbọchị Ise
Nchegharị bụ otu n'ime omume dị mkpa anyị niile nà-eme n'ịmata Kraịst dịka Onye-Nzọpụta anyị. Nchegharị bụ omume anyị ma mgbaghara bụ mmeghachi omume Chineke n'ebe anyị nọ site n'ịhụnanya zuru okè O nwerè n'ebe anyị nọ. N'ime atụmatụ ihe ọgụgụ a dị ụbọchị ise, ị gà-enweta ọgụgụ Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị ya na obere ihe òfùfè e merè iji nyere gị aka ịghọta nke ọma mkpa nchegharị dị nà njem anyị na Kraịst. Maka ọdịnaya ndị ọzọ, lee www.finds.life.church

Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge Ekeresimesi
Ụbọchi Iri Abụọ Na Ise
Malite ihe omume Ekeresimesi dị ọhụrụ site n'ime ihe n'ụzọ n'abụghị otu esi emebu ya n'oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Ụbọchị mmalite dị́ mma maka ihe omume a bụ Disemba 1, ebe mmalite dị ọsọ karịa ụbọchị a n'enye ohere ime ya n'ụzọ n'adịghị enye nsogbu. Ihe omume a gụnyerè ajụjụ ntụgharị uche gasị na ihe ndị aga-eme n'usoro iji kwụwa kwa ụbọchị chịm na Kraịst. Ihe omume a marà ezigbo mma maka ndị mmadụ ime ya n'otu n'otu, ezinụlọ imekọta ya, ma ọ bụ obere otù gasị imekọta ya.