Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara MATIU 6:24

Agụụ
4 Ụbọchị
Atụmatụ maka ụbọchị anọ a na-enyocha etú agụụ na-agụ anyị ịmata Chineke ma mee kà amata Ya, sì àkpali anyị n’ime nzube Ya maka ndụ anyị. Chọpụta ihe mere Devid ji bụrụ nwoke na-eso obi Chineke - na etu gị onwe gị ga-esi ebi ndụ na-enwe mmasị n'ebe Chineke nọ, na-egori mmekọrịta gị na Jizọs, na-atụkwasị ya obi ka o gboo mkpa gị. YouVersion chepụtara atụmatụ a.

Nchebe-Gasị: Izerè Ịta-Aka N'eze Na Ndụ Gị
ụbọchị ise
A na-etinye nchedo-gasị iji mee ka ụgbọala anyị ghara ịkpafu ma ọ bụ gbaba n'ebe ha n'ekwesịghị ịga. Anyị anaghị ahụ ha ruo mgbe ha dị anyị mkpa—mgbe ahụ obi ejupụta anyị n'ekele na ha nọ ebe ahụ. Gịnị ka ọ ga-apụta ma ọ bụrụ na anyị nwerè nchedo-gasị ná mmekọrịta anyị gasị, akpam ego anyị gasị, na ọrụ anyị gasị? Kedụ ihe nchedo ndị a pụrụ iyi kà? Kedụ otu ha pụrụ isi chekwaa anyị ka anyị ghara inwe obi mgbawa n'ọdịnihu? N'ime ụbọchị ise n'esote, ka anyị nyochaa etu anyị ga-esi guzobe nchedo-gasị nke onwe anyị.