Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara JỌN 1

Jọn
Ụbọchị Iri
Atụmatụ ihe ọgụgụ a dị mfe ga eduru gị gazuo Ozi Ọma nke Jọn site na mbido ruo na ọgwụgwụ.

Oziọma nke Jọn
21 Ụbọchị
N’ime atụmatụ isiakwụkwọ kwa ụbọchị a, ị ga-ezute Chineke Pụrụ Ime Ihe Nile – Onye Okike nke ihe nile – n’ụdị mmadụ, amụrụ iji wetara onye ọ bụla nzọpụta, n’ebe nile. Jọn kọrọ ọrụ ebube, ozizi, na ihe ndị enyi ya na Onye Nzọpụta ya, bụ́ Jisọs, na-eme kwa ụbọchị. A na-akpọkwa gị ka i soro Jisọs, ma nata onyinye Ya nke ndụ ebighị ebi. YouVersion mepụtara atụmatụ a.

Ịchọpụtagharị Ịma Mma Nke Oge Ekeresimesi
Ụbọchi Iri Abụọ Na Ise
Malite ihe omume Ekeresimesi dị ọhụrụ site n'ime ihe n'ụzọ n'abụghị otu esi emebu ya n'oge Amụma-Ọkwa-Ọbịbịa. Ụbọchị mmalite dị́ mma maka ihe omume a bụ Disemba 1, ebe mmalite dị ọsọ karịa ụbọchị a n'enye ohere ime ya n'ụzọ n'adịghị enye nsogbu. Ihe omume a gụnyerè ajụjụ ntụgharị uche gasị na ihe ndị aga-eme n'usoro iji kwụwa kwa ụbọchị chịm na Kraịst. Ihe omume a marà ezigbo mma maka ndị mmadụ ime ya n'otu n'otu, ezinụlọ imekọta ya, ma ọ bụ obere otù gasị imekọta ya.

Ka Anyị Gụkọọ Akwụkwọ Nsọ Ọnụ (Ọktoba)
Ụbọchị Iri Atọ Na Otu
Akụkụ nke iri nke usoro ihe ọgụgụ dị nkebi iri na abụọ, atụmatụ ihe ọgụgụ a n'eduru ọgbakọ gasị ka ha guzuo Akwụkwọ Nsọ ọnụ n'ụbọchị narị atọ na iri isii na ise. Kpọọ ndị ọzọ òkù ka ha soro gị gụọ ihe oge ọbụla ị malitere ọgụgụ otu akụkụ kwa ọnwa. Ihe usoro ọgụgụ a na-adị mma na Baịbụl gasị nwere ọdịyo—gee ha ntị n'ihe n'erughị minit iri abụọ kwa ụbọchị! Kwa nkeji nwere isi akwụkwọ gasị nke Agba Ọhụrụ na Agba Ochie, Abụ Ọma jupụtakwara ebe niile. Akụkụ nke iri na-egosipụta Akwụkwọ Ekliziastis, Jọn, Jeremaya, na Abụ Akwa.