Atụmatụ Ihe Ọgụgụ Gasị Dị N’efu na Ihe Ofufe Gasị metụtara JỌN 11:17
Ịru Újú
Ụbọchị Ise
Ịru újú nwere ike ịdị gị ka ihe ị n'enweghị ike idì. Ọ bụ ezie na n'agbanyeghị na ndị enyi na ezinụlọ ji obi ha niile na-enye nkwado na agbamume, ọ na ka-adị anyị ka ọ dịghị onye ghọtara ihe anyị na-agabiga n’ezie—na anyị nọ nanị anyị n'ime nhụjuanya anyị. N’ime atụmatụ ihe ọgụgụ a, ị ga-ezute akụkụ Akwụkwọ Nsọ gasị na-akasi obi ga-enyere gị aka iji anya ọzọ hụ ịru újú gị otu Chineke si chọọ ka ị lekwasị ya anya, nwee mmetụta dị ukwuu nke oké ịhụnanya na echiche dị mma Onye Nzọpụta anyị nwere maka gị, na nweta enyemaka maka ihe mgbu gị.
Ǹkà nke Imeri
Ụbọchi Asaa
Ndụ juputara na ndọghachi azụ, mfụ̀, ndakpọ olileanya, na ihe mgbu. “Nkà Nke Imeri” ga-enyere gị aka idị̀ mfụ̀, iru újú, na ihe mgbu ọbụla bịakwutere gị. Ọ bụ maka ịjụ ikwe ka ihe ndị dị ka njedebe mee ka ị daa mbà ma ọ bụ mebie ọganihu gị. Kama, kwe ka Chineke mee ka ha niile bụrụ mmalite-ọhụrụ gasị. Mgbe ndụ dị mgbagwoju-anya ma sie ike, adala mbà. Welie anya gị elu. N'agbanyeghị oge siri ike ma ọ bụ mfụ̀ na-egbu mgbu ị na-eche ihu, Chineke nọnyeere gị.