YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ NKE ABÙ 4

4
1Le, i mara nma, eyìm, le, i mara nma;
Anya-gi abua di ka nduru n'azu ákwà-nkpuchi-gi:
Agiri-isi-gi di ka ìgwè ewu,
Nke nēdina ala n'akuku ugwu Gilead.
2Ezé-gi di ka ìgwè nne-aturu nke akpachaworo aji-ha ọhu,
Nke siworo n'isa-aru rigota;
Nke ha nile chi umu abua umu abua,
Ọ dighi kwa nke b͕a aka nwa n'etiti ha.
3Dika ogho uhie ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua bu,
Okwu-ọnu-gi ma-kwa-ra nma:
Dika iberibe pomegranate ka akuku egedege-iru-gi bu
N'azu ákwà-nkpuchi-gi.
4Dika ulo-elu Devid, nke ewuru idebe ihe-agha, otú a ka olu-gi di,
Nke ekobeworo nnù ọta abua na ọgu iri,
Bú ọta ntà nile nke ndi-dike.
5Ara-gi abua di ka umu-mb͕ada abua nke bu umu abua nke otù nne-mb͕ada muru,
Nke nāta nri n'etiti urodi.
6Rue mb͕e ifufe anyasi nēfe n'ubọchi, mb͕e onyinyo nile nāb͕alaga kwa,
Mu onwem gēje n'ugwu myrrh,
Na n'ugwu ntà frankincense.
7I mazuru nma, eyìm;
Ọ dighi kwa ntupọ di n'aru-gi.
8Si na Lebanon som, nwunye ọhu nkem,
Si na Lebanon som:
Site n'elu Amana le anya,
Site n'elu Senia na Heamon,
Site n'ebe-obibi nile nke ọdum.
Site n'ugwu nile nke agu.
9I riwo obim, nwa-nnem nwayi;
I werewo otù nime anya-gi abua,
I werewo kwa otù ihe-inya-n'olu site n'olu-gi, rie obim.
10Le ka ihu-n'anya-gi nile si ma nma nke-uku, nwa-nnem nwayi, nwunye ọhu nkem!
Le ka ihu-n'anya-gi nile si di nma nke-uku kari manya-vine!
Le kwa ka ísì utọ nke manu-gi nile di nma nke-uku kari uda nile!
11Manu-aṅu nke si n'ub͕ub͕ọ-manu-aṅu abusi ka eb͕ub͕ere-ọnu-gi abua nābusi, nwunye ọhu nkem:
Manu-aṅu na miri-ara-ehi di n'okpuru ire-gi;
Ísì utọ nke uwe-gi nile di kwa ka ísì utọ Lebanon.
12Ubi ab͕ara ogige nke akpachiri akpachi ka nwa-nnem nwayi, bú nwunye ọhu nkem, bu;
Ebe-nsuputa-miri akpachiri akpachi, isi-iyi ab͕achiri ab͕achi.
13Ome-gi nile bu ogige ọma nke pome-granate, nwere nkpuru di iche iche di oké ọnu-ahia;
Henna, ya na osisi manu nard nile,
14Manu nard na saffron,
Calamus na cinnamon, ha na osisi nile nke frankincense;
Myrrh na aloes, ha na isi uda nile.
15Isi-iyi nke ubi nile ab͕ara ogige ka i bu,
Olùlù-miri nke juputara na miri di ndu,
Na miri-iyi di iche iche nke nērù erù site na Lebanon.
16Teta, gi ifufe Ugwu; bia kwa, gi ifufe Ndida;
Fekwasi ubim ab͕ara ogige, ka uda-ya di iche iche we rùpu.
Ka onye ihe-ya nātọm utọ bata n'ubi-ya ab͕ara ogige,
We rie nkpuru-ya di iche iche nke di oké ọnu-ahia.

Currently Selected:

ABÙ NKE ABÙ 4: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in