YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ NKE ABÙ 3

3
1N'elu ihe-ndinam n'abali ka m'chọrọ onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya:
Achọrọm ya, ma achọtaghm ya.
2M'siri, Biko, ka m'bilie, jegharia n'obodo buruburu,
N'amá nile na n'ebe nile sara mbara,
Ka m'chọ onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya:
Achọrọm ya, ma achọtaghm ya.
3Ndi-nche ndi nējeghari n'obodo buruburu hurum:
M'we si ha, Ùnu ahuwo onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya?
4Ọ bu nání nwantī ka m'siri n'ebe ha nọ gabiga,
Mb͕e m'chọtara onye ahu nke nkpuru-obim huru n'anya:
Ejiderem ya, arakwaghm ya aka,
Rue mb͕e m'mere ka ọ ba n'ulo nnem,
Na n'ime-ulo nke nwayi turu imem.
5Unu umu-ndinyom Jerusalem,
Ejim nne-mb͕ada nile, ejikwam nne-ele ọhia nile, b͕a unu iyi,
Unu akpọtela, unu eme-kwa-la ka ihu-n'anya teta, ma-ọli,
Rue mb͕e ọ gātọ ya utọ.
6Ọnye bu nka nke nēsi n'ọzara arigota dika ogidi di iche iche nke anwuru-ọku,
Nke anēsurere ya ihe-nsure-ọku nēsì ísì utọ, bú myrrh na frankincense,
Site n'ihe nile egwere egwe nke onye-ahia?
7Le, ọ bu ihe-ndina-ya, bú nke Solomon nwere;
Ọgu ndi-dike atọ di ya buruburu,
Site na ndi-dike nke Israel.
8Ha nile ji mma-agha, ha bu ndi emeworo ka ha muta ibu agha:
Onye ọ bula, mma-agha-ya di n'úkwù-ya,
N'ihi egwu n'abali.
9Eze, bú Solomon, emeworo onwe-ya otù palanquin
Site n'osisi Lebanon.
10Ogidi-ya nile ka o jiri ọla-ọcha me,
Ala-ya ka o jiri ọla-edo me, ebe-ọnọdu-ya ka o jiri ogho ododo me,
Etiti-ya, eji ihu-n'anya me ka ọ buru pavement ọma,
Site n'aka umu-ndinyom Jerusalem.
11Puanu, umu-ndinyom Zaion, lekwasi Solomon, bú eze, anya,
Ka o kpuru okpu-eze nke nne-ya kpubeworo ya n'ubọchi ọlulu-nwunye-ya,
Na n'ubọchi ọṅù nke obi-ya.

Currently Selected:

ABÙ NKE ABÙ 3: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in