YouVersion Logo
Search Icon

ABÙ ỌMA 99

99
1Jehova bu eze; ka ndi nile di iche iche ma jijiji:
Ọ nēbi n'etiti cherubim; ka uwa me nkpatu.
2Jehova di uku nime Zaion;
Onye di elu ka Ọ bu kwa n'elu ndi nile di iche iche.
3Ka ha kele aha-Gi nke di uku, nke anātu kwa egwu ya:
Onye nsọ ka Ọ bu.
4Ike nke eze nāhu kwa ezi ikpé n'anya;
Gi onwe-gi emewo ka izi-ezi guzosie ike,
Ezi ikpé na ezi omume ka Gi onwe-gi meworo nime Jekob.
5Bulienu Jehova, bú Chineke-ayi, elu,
Kpọ-kwa-nu isi ala n'ebe ihe-nb͕akwasi-ukwu-Ya di:
Onye nsọ ka Ọ bu.
6Moses na Eron n'etiti ndi-nchu-àjà-Ya,
Samuel kwa n'etiti ndi nākpọku aha-Ya;
Ha nākpọku Jehova, Ya onwe-ya we za ha.
7N'ogidi igwe-oji ka Ọ nāgwa ha okwu:
Ha debere ihe-àmà-Ya nile, na ukpuru O nyere ha.
8Jehova, bú Chineke-ayi, Gi onwe-gi zara ha:
Chineke Nke nēbupu nmehie ka I buru ha,
Ma I bu onye nābọ̀ ọ́bọ̀ omume nile ha,
9Bulienu Jehova, bú Chineke-ayi,
Kpọ-kwa-nu isi ala n'ebe ugwu nsọ Ya di;
N'ihi na onye nsọ ka Jehova, bú Chineke-ayi, bu.

Currently Selected:

ABÙ ỌMA 99: IGBOB

Highlight

Share

Copy

None

Want to have your highlights saved across all your devices? Sign up or sign in